2022 Igbo Anglican Bible Study - Study 11 to study 16 (2022 CON Bible Study)

2022 Igbo Anglican Bible Study - Study 11 to study 16 (2022 CON Bible Study)

2022 Igbo Anglican Bible Study - Study 11 to study 16 (2022 CON Bible Study)

2022 Igbo Anglican Bible Study - Study 11 to study 16 (2022 CON Bible Study)

2022 Igbo Anglican Bible Study - Study 11, March 13, 2022.


IHE OMUMU NKE IRI NA OTU. Sonde Nke Abuo N'ime Lenti MAACH 13, 2022.

ISIOKWU NCHIKOTA: Onyenweanyi anyi Chineke Na Ochichi nke Udo

NKEBI ISIOKWU: 
Omuraa Chineke nke Onye nke Kraist

EBEAGAAGU:  Jon 1:1-4

EBUMN'OBI IHE OMUMU A:

i. Ka akowaa Chineke dikaNdun'ime mmadu obula

ii. Ka anyi kowaputa otu kachasi nma ndi otu Kraist g'esi na-ekpori ndu ha n'efu uwa ma n'elu igwe.



OKWU NKOWA:

 Obughi nani na Onye nweanyi na Chineke n'enye mmadu ndu karna na Ya onwe Ya bu Ndu n'ime rikpuru obi nile di ndu n'elu uwa. Ebe anyi guru ihe ogugu anyi taa n'echetara anyi na o bu ume Chineke kunyere n'ime mmadu mbu o kere bu ihe mere ya rnkpuru obi di ndu. Dika odi na Jon 17:3,1 mara Chineke bu ndu n'ezie n'ini na Ya onwe Ya bu "ISI IYI nke Ndu". Ihe bu ndu adebereghi n'ihe obula anya n'ahu n'uwa "n'ihi na Ndu kariri ihe oriri na ihe onunu" Luk 12:23. Mmadu apuru idi ndu n'anu aru ma burukwa onye nwuru anwu na mmoo? Kedu ka o si burn ezipkwu? Ihe ndi a na ndi ozo ka anyi ga arughari uche n'ihe omumu anyi taa.



IHEOMUME

1. Site n'ebe anyi guru na Jon 1:1,4, kedu ka I ga esi kowaa na Chineke buNdun'ezie? Lee anya na Deut 32:39; Jon 11:25

2. Dika odi na Josh 1:8, Jon 17:3, Ilu 8:36, keduuzo kachasi nma iji kpori ndu nke sitere na Chineke?

3. Mmadu apuru ibu onye nwuru anwu na-aga ije? Kowaa ya ma oburu eziokwu. Ndi Efesos 2:1 -3, Nkpughe 3:1-3

4.Kedu ka onye nwuru anwu n'ime mmoo g'esi nweghachute ndu ya ozo? Ndi Rom 8:10-11, Ndi Galetia2:20; 5:24


OKWU NCHIKOTA: 

O bu nani onye bu isi iyi nke Ndu puru inye ma narakwa madu obula ndu. Obu site n'ebe O no ka anyi rule si puta, o bukwa Ya onwe Ya ka anyi nile ga-alaghachikwuru. Ya mere, I mara Ya na ezi nmekorita anyi na Ya n'elu uwa nu nani ihe ga-akowa nmekorita anyi na Ya na ndu ebighebi n'elu igwe.

OKWU NKE NTUGHARI UCHE: 

Onye obula bu onye iro nke Chineke, bu onye nwuru anwu na-aga ije.

AMAOKWU IBU N'UCHE: Jon 17:3 "Ma nka bu ndu ebighebi ahu, ka ha mara Gi, Nke nani Gi bu ezi Chineke, marakwa onye izitere, bu Jisos Kraist".


2022 Igbo Anglican Bible Study - Study 11 to study 16 (2022 CON Bible Study)

2022 Igbo Anglican Bible Study - Study 12 March 20, 2022.


IHE OMUMU NKE IRI NA ABUO. Sonde Nke Ato N'ime Lent MAACHI 20, 2022

ISIOKWU NCHIKOTA: Ony enweani na Chineke na Ochichi nke udo

ISIOKWU: Chineke dika onye okike: onye kere Eluigwe na Uwa (Agba nke mbu)

EBEAGAAGU:  Aizaya45:5-9

EBUMN'OBI IHE OMUMU A:

i. Ka enyere anyi aka imara na Chineke naniya bu Onye okike na onye nchekwa nke uwa.

OKWU NKOWA:

 Madu iche na odighi onye kere uwa a, dika madu iche na odighi onye meputara elekere anyi na-agba n'aka. Dika onye ama-ama kpum isi na-agu egwu kwuru si: "Ihe n'ile anyi na-ahu taa abiaghi na mberede, n'ihi na mberede apughi ime ihe k'odi nma n'anya". Akwukwo Jenesis isi nke mbu nile., kowari n'ozuzu oke otu Chineke jiri kee ihe nile. Obura na anyi ahuta Chineke dika onye okike, anyi g'enwe ezi nkwanye ugwu na nsopuru di ukwu nye Chineke n'ime obi anyi

IHE OMUME

1. Site n'ebe anyi guru taa na Aizaya 45:5-9 kedu ka iga-esi mee ka onye n'ekweghi wee kwenye na Chineke bu onye kere uwa nile? Tulekwa Jon 1:1-4

2. Gugharia mpaghara nke mbu nke okwukwe nke Ndi Ozi" Ya na Okwukwe nke "Nicea" ma metu aka n'otutu ihe n'egosi na Chineke bu onye okike.

3. Kparita uka na omumua anyi mara Chineke dika onye okike, g'esi kwalite okwukwe anyi n'onodu iti aka mgba na ihe ima aka n'iru di iche iche iji ma-atu, onodu nyiri odi ndu onwu ka nma? Legara anya Abuoma50:15;Aizaya41:18; 43:19; OluNdi Ozi 16:25-26


OKWU NCHIKOTA:

 Chineke bu onye Okike kpom kwem. Enwezuga Ya, o dighi onye ozo. Obughi nani onye Okike kama o bukwa onye nchekwa nke uwa nile. Obu ihe jogbura onwe ya taa n'otutu mmadu n'efe ihe ekere eke ma rapu ife onye obu Ya onwe Ya kere ihe nile. Ya mere, ka anyi biaghachi n'ebe Onye kere ihe nile k'onwe diri anyi na nma.

OKWU NKE NTUGHARI UCHE: O buru na o bughi Chineke, keduzi onye kere Chineke bu onye Okike? Tugharia uche na nke a.

AMAOKWU IBU N'UCHE: Aizaya 45:7"Abu m onye na-akpu Ihe na onye n'eke ochichiri; Abu m onye n'eme udo na onye n'eke ihe ojoo; mu onwem bu Jehova onye n'eme ihe ndia nile"

2022 Igbo Anglican Bible Study - Study 11 to study 16 (2022 CON Bible Study)

2022 Igbo Anglican Bible Study - Study 13, March 27, 2022.


IHE OMUMU NKE IRI NA ATO. Sonde Nke Ano n'ime Lenti (UKA NDI NNE) MAACHI 27, 2022.

ISIOKWU NCHIKOTA: Onyenweanyi Chineke na Ochichi nke udo

NKEBI ISIOKWU: Omuma Chineke nke onye nke Kraist.

ISIOKWU: Chineke Dika Onye Okike 2: Okike Nke Mmadu N'oyiyi nke Chineke. EBE AGAAGU: Jen 1:26-27

EBUM N'OBI IHE OMUMU A:

i. Ka anyi ghota ihe oputarabu "Oyiyi nke Chineke" na ihe obu na Chineke kere madu n'oyiyi Ya.

ii.Ka anyi mara ihe Chineke na-atu anya n'aka anyi dika ndi o kere n'oyiyi nke Ya.

iii.Ka anyi kpoputa nzoukwu n'ile anyi g'azo ka oyiyi nke Chineke were buru ihe enweghachitere n'ozuzu oke ya n'ime anyi.

OKWU NKOWA: Iwe ezi nghota n'okwu a bu oyiyi nke Chineke bu ntonala ghere eghe g'eme ka anyi baa nnkwu ura ma mezue ebum n'obi Chineke. Ighota otu Chineke siri kee anyi n'oyiyi Ya g'enyere anyi aka ihuta ihe ngbado ukwu nye ugwu na nsopuru anyi nwere nakwa ebum n'obi Chineke ndu na olu anyi n'alu. Edeputara ya nkeoma na Jenesis 1:26-27 na madu bu ihe ekere n'oyiyi nke Chineke, ma nwoke ma nwanyi. Ya mere, o bu oke n'olu anyi dika ndi otu Kraist inwere nnukwu oghere anyi nwere kwusaa n'ezie na anyi bu ihe ekere n'oyiyi nke Chineke (Ndi Efesos 5:1-11). Dika anyi na ekpere ndi nne na umunwanyi nile ekpere oma n'echiehe oma n'ubochi taa bu uka ndi Nne, anyi na ario ka Chineke nye ha ogologo ndu na am isi ike ka ha ghoro ozi kpuru nke okwukwe ha dika ndi ekere n'oyiyi nke Chineke n'elu uwa site na Jisos Kraist bu Onyenweanyi.

IHE OMUME

1. Guo Jen 1:27-28 ma kowa ihe oputara na Chineke kere madu n'oyiyi Ya. Ginikwa ka oyiyi nke Chineke dika ya? Lee anya na Ndi Efesos 5:l-2;NdiFilipai2:14-15

2.Chineke kere mmadu obula n'oyiyi nke Ya, ma nwoke ma nwanyi. Site na Taitos 2:1-10, kedu ka ndi Nne anyi g'esi gosiputa oyiyi nke Chineke na ndu ha?

3.Kpoputa nzoukwu putara ihe anyi kwesiri izo ka oyiyi nke Chineke bum ihe enweghachitere n'ozuzu oke n'ime mmadu. Guo ebe ndia Abuoma 95:7-8; OluNdiOzi 3:19; 1 Jon 4:7-8

4. Gini ka anyi na-aghaghi ime iji wee gbanari nmeto na mpito dika ndi kere n'oyiyi nke Chineke? Josh 1:8; Dan 1:8; Ndi Efesos 5:11

OKWU NCHIKOTA:
Uru obula anyi bara dika madu sitere n'aka onye kere anyi. O burn na apughi ira idi nma na idi ukwu nke Chineke onu, ya mere, mniadu nke ekere n'oyiyi Ya aghaghi iwekwa ebube di otu a. Ana-atu anya n'aka anyi ka anyi kpachara anya n'egosiputa udi nke Chineke ngwa ngwa arnuru anyi ozo.

OKWU NKE NTUGHARI UCHE: Obu nani ukpuru ibi ndu ezi omume ga enye anyi ike iban'oyiyi ebighebi nke Chineke.

AMAOKWU IBU N'UCHE: Ndi Efesos 5:1-2 "Ya mere burunu ndi n'eghomi Chineke dika umu Kraist anyi bukwa unu n'anya rarakwa onwe Yan ye n'ihi anyi dika ihe echere n'iru Chineke na aj a a achuru nye Ya ka o burn isisi nke ihe isi uto"

2022 Igbo Anglican Bible Study - Study 11 to study 16 (2022 CON Bible Study)

2022 Igbo Anglican Bible Study - Study 14, April 3, 2022.


IHE OMUMU NKE IRI NA ANO. Sonde nke ise n'ime Lenti EPREL 3, 2022

ISIOKWU NCHIKOTA: Onyenweanyi Chineke na Ochichi nke udo

NKEBI ISIOKWU: Omuma Chineke nke onye nke Kraist

ISIOKWU: Chineke Nice mgbe Ochie

EBE AGA AGU: Joshua 24:1 -15

EBUM N'OBI IHE OMUMU A:

i. Ka achoputa otutu ihe mere Chineke jiri debesie ike akuko nile maka ihe mere na mgbe ochie.

ii. Ka anyi wee buru ndi amara aka n'iru ka anyi wee dozie uzo nile anyi nkeoma wee si otua gbanari n'ubochi nguko nke ihe nile.



OKWU NKOWA:

 Akuko mgbe ochie putara nkowa oma maka otutu ihe mere na mgbe gara aga, karisia dika osi metuta ndi mmadu. O putara ihe nkeoma n'ime akwukwo nso na Chineke bu onye n'adighi echem ihe nile mere mgbe ochie n'ihi na Ya onwe Ya bu ochie dike. Ya onwe Ya j ikwa n'ozuzuoke akuko banyere ihe nile mere mgbe ochie dika ihe ndia na aouta ihe. Chineke mere ka ufodu ndi mmadu deputa nkeoma akuko banyere ihe mere mgbe ochie maka Umu Izrel. Nke ainere anyi ji wee akwukwo ndi a dika Ndi Eze nke Mbu na Nke Abuo nakwa ihe emere n'ubochi Ndi Eze, Nke mbu na nke Abuo. Chinke sitere na aka Joshua wee chetara Umu Izrel otu ha si buru ihe ha bu taa n'uwa nile (Josh 24:1 -15)

IHE OMUME

1. Kedu ka ebe anyi guru taa na Josh 24:1-15 g'esi mee ka anyi huta Chineke dika Chineke mgbe ochie? Lekwuo anya na Matiu 25:34-45

2. Gini mere Chineke jiri kpachaa anya dabere anyi akuko ihe mere mgbe ochie? Opupu 17:14; Ndi Rom 15:4; Ekles 12:14; Nkpughe 20:11-13.

3. Gini kwesiri ibu omume anyi nye Chineke a bu onye n'edebezu akuko ihe nile mere n'oge gara aga? Kedukwa ka anyi g'esi kwado maka ibi ndu nke idebe akuko mgbe ochie n'ime nzuko anyi taa? Guo Luk 1:1-4

OKWU NCHIKOTA: 

Dika ogbako nke Chineke, anyi aghaghi iguzoro chim wee merie ihe itiakamgba n'ile na-adoghachi anyi azu idebe akuko ihe mere mgbe ochie n'ihi na Chineke n'onwe bu onye n'edebe akuko mgbe ochie. Ya onwe Ya bukwa ochie dike. N'ihi nke a, ka madu obula gharakwa ichefu na Chineke aghaghi ikpughe otu anyi si mee omume nile n'ubochi ikpeazuma ezi ihe, maobu ajo ihe. Gini g'abu ihe edere banyere ndu gi n'elu uwa mgbe aga-ekpu ya? O ga-abu ezi ihe, k'oga-abu ajo ihe?

OKWU NKE NTUGHARI N'UCHE: Nkpughe 20:12 "M'we hu ndi nwuru anwu nile, ndi uku na ndi ata, ka ha n'eguzo n'iru eche-eze ahu; ewee saghe akwukwo di iche iche, asaghekwara akwukwo ozo, nke bu akwukwo nke ndu, ewee kpee ndi nile nwura anwu ikpe site n'ihe nile edereri n'akwukwo ahu di iche iche dika olu ha nile si di"





2022 Igbo Anglican Bible Study - Study 11 to study 16 (2022 CON Bible Study)

2022 Igbo Anglican Bible Study - Study 15, April 10, 2022.



IHE OMUMU NKE IRI NA ISE. Sonde nke isii n'ime Lenti (UKAIGU NKWU) EPREL10,2022.

ISIOKWU NCHIKOTA:  Onyenweanyi Chineke na Ochichi nke udo

NKEBI ISIOKWU: Nmeri nke Kraist (1)

ISIOKWU: Onye Nzoputa Nwedara Onwe Ya N'ala

EBE AGA AGU: Zekaraya 9:9-10

EBUM N'OBI IHE OMUMU A:

i.  Ka akparita uka nweda onwe n'ala nke Jisos Kraist n'mbugo n'el oche-eze Ya nke Uwaa. Ya na

ii. Ka akowaa ya n'uka bu akuko maka olu Nzoputa nke Jisos luru n'ime ulo ukwu Jerusalem.

OKWU NKOWA:

Amuma nke a biara na nmezu mgbe Jisos Kraist gara Jerusalem dika Eze bu nke anyi kporo "uka I gu Nkwu". Edeputara akuko maka ndi nile dere ozioma nile n'agba ohu dere akuko maka njema Matiu 21:1-11, Maak 11:1-11; Luk 19:29-44, nakwa Jon 21:12-19. O bu nani njem ojere dika Eze bu ngosiputa o gosiri onwe Ya dika onye ukwu n'iru ora n'ime ije ozi Ya nile na mgbe ahu. Nke a ka omere ka onwee mezue ihe edeworo na-akwukwo Nso.

 Zekwara ya bum amuma maka obibia Jisos mgbe obibia nke Alexander di ukwu biara na Jerusalem bu nke wetara oke egwu nye ndi madu, mana nani ndi Juu ka enyere iwu ka ha nuria matikwaa nkpu onu n'ihi na Eze ha abiawo. Ebum n'obi nke obibia Jisos n'ime onodu mgbagwoju anya ha bu ka owetara ndi nile g'atukwasi Ya obi nzoputa. Obibia nke Jisos na obibia nke Alexanda abughi ofu n'ihi na Alexander gara njem nke ya n'elu inyiyia eji eje agha new n'egpsi rnkpako di ukwu ya na ndi agha ya nile. Mana Jisos jiri nwa inyiyia ibu gaa njem nke Ya n'obi di umeala nke nweda n'ala. Ya mere ndi nabatara obibia nke Jisos bu umuntarakiri n'abughi ogaranya. Ndia nwere nani uwe ha na igu nkwu n'atogboro Jisos n'uzo ya. Ndi nile amaara aha ha n'ime Jerusalem anabataghi Ya, Jisos kwesiri ima ha ikpe ma nyekwa ha ntarama ahuhu n'ihi omume ha mesoro ya, ma kama nke ahu, owetakwara ha Amara na Ngbaghara nmehie n'obi umeala (Jon 3:17). Ozokwa, Jisos gosiputara ikikere I bu Eze ya na onye isi nchuaja Ya n'ime ulo uku Chineke site n'ikwatu ihe nile ndu na-atu mgbere ahia ji ere na azukwa ahia ya na ebe ino odu nile nke ndi na-apunara madu ihe na ndi nere nduru n'ulo Chineke ma mgbe o mesiri nke a, ogwoo ndi nile aru ha na-adighi ike.

IHE OMUME

1. Kedu ihe nwa inyinye ibu na inyiya agha n'egosiputa na-akuko nleta nke madu? Kedukwa ka igesi kowa n'ezie udiri njem Jisos j ere n'elu nwa inyiya ibu nta nke gosiputara nweda onwe onwe n'ala?

2. Lee anyana Luke 4:18 na Matiu 21:12-14 ma kowaa ka omume Jisos mere n'uine ulo uku Jerusalem siri zie ezi dika onye nzoputa nk'uwa.

3. Nwere omume ndi nagbanwe ego na ndi n'ere nduru n'ime uku Chineke mere wee tunyere omume ufodu an'eme n'ime ulo nzuko anyi taa, ndi okwu chukwu ha nile bum aka otu aga-esi nweta aku n'uba.

4. Dika umuntakiri na ndi ogbenye n'eti Hozana nye Jisos nke putara "Zoputa anyi ugbua" obi adighikwa ndi isi nchuaja na ndi ode akwukwo nma. Kedu ka anyi g'esi kowa udi omume di otu a na-achi? Onye puru izoputa anyi n'ochichi nchigbu nke anyi n'ime ya taa?

OKWUNCHIKOTA

Nmeri ebighebi nke Jisos Kraist dika onye nzoputa nk'uwa bu ihe ogosiputara n'ubochi o gara njem na Jerusalem n'elu nwa inyiya ibu nta. Nke a ga-aburu anyi ihe ilere anya mgbe dum dika ndi ndu n'ogogo di iche iche nke okpukpo oku anyi na n'olu nile nke anyi na alu ndu a, ka enwe wee onu na nzoputa puru iche nye ndi anyi na-elekota.

OKWU NKE NTUGHARI UCHE: Uka igunkwu enweghi uru obula obara ma oburu omume nbuli onwe elu ka di n'ime anyi.

AMAOKWU IBU N'UCHE: Zekaraya 9:9  "Tegharia egwu onu nke uku, gi ada Zion; tie nkpu gi ada Jerusalem; lee, Eze gi na-abiakute gi, onye ezi omume nan were nzoputa ka obu; onye ewedara n'ala nke na-anokwasikwa n'inyiya ibu, obuna na nwa inyinya bu nwa inyiya ibu".


2022 Igbo Anglican Bible Study - Study 11 to study 16 (2022 CON Bible Study)

2022 Igbo Anglican Bible Study - Study 16, April 17, 2022.


IHE OMUMU NKE IRI NA ISII. UBOCHIISTA EPREL 17, 2022.

ISIOKWU OKWU NCHIKOTA: Onyenweanyi chineke na ochichi isi nke udo

NKEBI ISIOKWU: Nmeri Nke Kraist (2)

EBE AGA AGU: Matiu 28:1-8

EBUM N'OBI IHE OMUMU A:

1. Ka a kuzie ihe omimi banyere Ista na nghota onye nke onye nke Kraist dika o metutara mbilite n'onwu.

2. Ka anyi gosiputa ihe ndi gosiri na Kraist biliri n'onwu ya na:

3. Ka akowaa n'uju uru mbilite n'onwu nke Kraist bara n'etiti ndi nke Kraist.

OKWU NKOWA

Ista bun meme n'egosi nbilite nke Kraist si n'onwu bilie nwee baa na ndu. Obu nmeme eji echeta ezi ihe nke putara n'ezi ihe, Eze ndi eze, na ONyenwenu kachasi ndi nwenu niile, dika Ista putara nmeme icheta mbilite n'onwu nke Kraist, nbilite n'onwu putara nbili nke Jisos Kraist biliri n'onwu dika agbasiri ama onwu ya na olili ya ike abali ato. Nbilite n'onwu di iche na "emere ka mmadu kutetu ume ndu" n'ihi na Nbilite n'onwu ke Kraist gosiputara nmeri Jisos Kraist meriri onwu.

 N'agbanyeghghi na ndi uche ha gbagoro agbogo ekwetaghi na Kraist si n'onwu bilie, ma na enwere otutu ihe itunaya n'awa agbata oyi bu nke kudara ekweghi ekwe ha. O bu emume gosiputara ike nke idi uku nke chineke. N'ihe omumu nke taa, anyi ga achoputa nghota zuru oke na uru nbilite n'nowu Kraist bara ndi nke Kraist.

IHE OMUME

1. Site na nghota anyi nwetara, n'okwu nkowa ya nakwa n'ebe anyi guru taa, gini bu "nbilite n'onwu"? kedu ka osi di iche na emere ka madu si n'onwu bilie dika ihe mere nan du Lazaros na John 11:43-44; 20; 11 -19

2.Site na nghota ihe omumu nke taa, kowaa ihe di iche na "Ista" na "Nbilite n'onwu"

3. Site n'ebe ndia agagu n'akwukwo nso, kedu ihe ndi kowari n'ezie na Kraist si n'onwu bilie" Matiu 27:62-66, 28:2-6, 11-15, Olu Ndi Ozi 1:9-l 1,1 Ndi Korinth 15:3-8

4. Kowaputa otutu uru di na nbilite n'onwu nke Kraist. 1 Ndi Korinth 15:12-22,55-57, Luk 24:45-47


OKWUNCHIKOTA

Chineke gosiputara ike ya site na ime ka Jisos Kraist si n'onwu bilie. Nke a di iche n'ikwu, n'emere ka mmadu kutetu ume ndu. Nbilite n'onwu nke Kraist gosiri nmeri anyi nwere n'ebe onwu ebighebi di nakwa n'ebe ike nile nke ochichiri bu nke n'emekpa anyi aru n'ime odu di iche iche. Anyi nwekwara nmeri n'ebe oku ala nmo na n'ebe onwu ebighiebi di. Nzokwa, ndi nke Kraist nile nwekara olileanya siri iwe nmeri ebighebi n'ogwugwu ihe nile.

OKWU NKE NTUGHARI UCHE:
Nbilite n'onwu bu ihe ngbado ukwu anyi nwere maka iwe ndu ebighebi.

AMAOKWUIBU N'UCHE: 1 Ndi Korinth 15:55-57 "Onwu, olee ebe nmeri gi di? Onwu olee ebe ogbugba gi di" ihe ogbugba nke onwu onwu bu nmehie; ike nke nmehie bukwa iwu, ma ekele diri chineke onye n'enye anyi nmeri site n'aka onyenwanyi Jisos Kraist"
Post a Comment (0)
Previous Post Next Post