Anglican Bible Study Igbo (Study 6) IHE OMUMU NKE ISII, February 6, 2022

Anglican Bible Study Igbo (Study 6) IHE OMUMU NKE ISII, February 6, 2022

Anglican Bible Study Igbo (Study 6) IHE OMUMU NKE ISII, February 6, 2022

Igbo Bible Study Version   IHE OMUMU NKE ISII

Sonde Nke Ise ka Epiphani Gasiri.         FEBUWARI 6, 2022


ISIOKWU NCHIKOTA: Onyenweanyi Chineke Ochichi i nke udo

NKEBI ISIOKWU: Uzo Nkpughe nke Chineke Nye Umu Mmadu (Agba nke ise)

ISIOKWU: Jisos Kraist

EBE AGA-AGU: Hibru 1:1-3

 

 EBUMN'OBIIHE OMUMU A:

i. Ka egosi na Jisos Kraist bu ekwuchaa agwu na nkpughe nke Chineke nye umu mmadu

ii.Ka akowaputa Ichi-isi nke Jisos Kraist n'uwa nakwa Ichi-isi ebighiebi nke Jisos Kraist n'elu igwe.


OKWU NKOWA:

Nkebi okwu a bu "N'uzo di iche iche" (KJV) n'ezie putara "N'otutu ebe" n'ime akwukwo Nso agba ochie. Nke a putara na obughi site nani n'onu otu onye amuma ka esi nye nkpughe nke Chineke. Kama onye amuma obula natara nkpughe nke a dika osi nye ye. N'otu aka ahu, nkebi okwu a bu "N'uzo di iche iche" (KJV) ozokwa putara na ufodu ndi amuma Chineke nuru olu nke Chineke, ufodu bukwa site n'ihe eji ajuta Chineke ase bu "Urim Na Tumim" ufodu nkpughe sitekwara na iro nro di iche iche ya na ihu ohu di iche iche.


Nkpughe nile di na agba ochie bu ihe digasi na mkpirisi na mkpirisi, obu ezie na ha di otutu ma dikwa n'udi di iche iche. N'otu aka ahu, enwekwara imilildti ndi amuma, ma ha nile bum amuma nani na mkpirisi otu o si na di, o bu n'ime Kraist ka nkpughe nke Chineke zuru oke. Ihe omimi nile nakwa ebumn'obi nile nke Chineke nye mmadu ka ejikotaran'otu n'ime Jisos Kraist.

 

IHEOMUME:

1.  Gini bu nghota gi na-ahiriokwu nke a "Jisos bu ekwuchaa agwu nke nkpughe Chineke nye mmadu?

2.  Gini mere ijiri chee na Jisos kachasi uku nye uzo nile ozo esi enweta nkpughe? Matiu 17:5; Olu Ndi Ozi 3:22-24.

3.  Guo Ndi Hibru 1:2 ozo ma kowaa ezi ihe ato di n'ime Kraist nke a apughi ichoputa n'ime onye amurna obula di na-agba ochie.

4.  N'igbado ukwu n'ezi ihe ato di n'ime Jisos Kraist na Ndi Hibru 1:2, kedu ka 1 ga esi kowaa ichi-isi nice Jisos Kraist ma n'uwa ma n'elu igwe? Jon 14:9,10; Ilu8:26-31; Abuoma ll0:l,2; Phil2:5-ll


OKWU NCHIKOTA: Idi ukwu nke Jisos Kraist kariri uzo nile obula Chineke jiri nye umu mmadu nkpughe. Nke a nwere ngbado ukwu n'eziokwu na Jisos bu okpara Chineke, burukwa onye ya na Chineke no ma burukwa onye Chineke roputara ichikota ihe nile n'okpuru ya, n'ihi na site na Jisos ka Chineke ji kee uwa. Ya, mere, Jisos bu onye na-achi isi nye ihe nile, ma nke anya na-ahu, ma nke mmoo, ya onwe ya na Chineke ga-achi isi ebighiebi n'elu igwe.


OKWU NTUGHARI UCHE: Nkpughe ikpeazu nke Chineke bu ngosiputa izu oke nke Chineke nye umu mmadu.

AMAOKWU IBU N'UCHE: Ndi Hibru 1:1-2 "Chineke, mgbe o gwarari nna anyi ha okwu n'oge ochie ndi amuma n'iberibe akwukwo di iche iche na uzo di iche iche, o gwara anyi okwu n'ogwugwu ubochi ndi a n'ime okpara, o doro onye nketa nke ihe nile, onye o sitekwara n'aka ya mee uwa nile"

Anglican Bible Study Igbo (Study 6) IHE OMUMU NKE ISII, February 6, 2022

 

Anglican Bible Study Igbo (Study 6) IHE OMUMU NKE ISII, February 6, 2022

Post a Comment (0)
Previous Post Next Post