2022 Igbo Anglican Bible Study - Study 7 to study 10 (2022 CON Bible Study)

2022 Igbo Anglican Bible Study - Study 7 to study 10 (2022 CON Bible Study)

2022 Igbo Anglican Bible Study - Study 7 to study 10 (2022 CON Bible Study)


2022 Igbo Anglican Bible Study - Study 7 to study 10 (2022 CON Bible Study)

Study 7 February 13, 2022 (IHE OMUMU NKE ASAA)

Sonde akporo Septuajesimaa         (Sonde nke ato tutu Lcnti erne)


ISIOKWU NCHIKOTA: Onyenweaiiyi na Chineke na Ochichi nke Udo

NKEB1 ISI OKWU: Omuma Chineke nke onye N'eso uzo Kraist

ISIOKWU: Onye nwanyi Chineke nke puru ime ihe nile EBE AGAAGU: Opupu 15:1-11

 

EBUM N'OBI IHE OMUMU A: Ka enyere anyi aka ighota ihe

oputara bu na Chineke puru ime ihe nile na ihe kwesiri ibu akparamagwa ndi nke Kraist dika osi metuta isiokwu a.

OKWU NKOWA: Taa n'egosi mmalite na nkwadebe maka oge obubu onu (Septuajesima Sonde) n'ihi ya, anyi ga na elegara anya n'isiokwu a bu "Onye nweanyi na Chineke dika onye ji ikikcrc na ike n'ebe ihe nile ekere eke n'uwa na eluigwu bu ihe juputara n'ime akwukwo Nso nile. Site na-akuko mgbe ochie, ma gafee ebe a na-achi achi nile nakwa ogbo nile nke uwa, Chineke n'egosiputa ichi-isi ya mgbe nile, nakwa obi umeala ya n'ime idi ike uku n'ochichi ya, n'uzo di oru a ka ojiri nwedaa Ekwensu na ajo usiiu ya nile n'ala ma merie ha ebighebi. Ihe omumu a ga enyere anyi aka ighota udiri nke Chineke, ichi isi ya nakwa idi ire nke ebighebi ya.

IHEOMUME:

1. Site n'ebe anyi guru taa, weputa ma kowaa otutu njirimara putara ihe n'egosi na Chineke puru ime ihe nile.

2.       Site n'ebe anyi guru ihe ogugu, kowaa na nke nke otu Chineke siri gosiputa ma gaa n'iru n'igosiputa ildkere na ike o nwere nani ya n'ihe nile metutara mmadu na ihe ekere eke lekwuo anya na Josh 10:12-14; Dan 4:30-34; Matin 28:1-4

3.       Kedu ka ufodu mmadu siri lelie ngosiputa ike nke Chineke anya n'ogbo anyi taa ma atunyere Opupu 5:2; Olu Ndi Ozi 12:21-22

4.Gini kwesiri ibu akparamagwa anyi dika ndi otu Kraist na oburu na anyi na-atu anya ngosiputa ike nke Chineke n'ogbo anyi taa Jen 17:1; Opupu 14:1.3-14; iTu 3:5-7; Ndi Rom 9:20

OKWU NCHIKOTA: Anyi ekwesighi inwe obi abuo na chineke di njkere mgbe nile igosiputa ebube na ike ya n'ihe metutara mmadu ka mmadu nile wee hu ya (obuna ma ndi n'ekwesighi ekwe). O bu ihe ga-abara anyi ezi uru ma anyi muta inweda onwe anyi ma rukwasi ya obi n'ime ogu na mgba nile nke ndu a. O bu Onyenweaiiyi Chineke nke puru ime ihe.

OKWU MAKA NTUGHARIUCHE: Nnabata na nkwenyesike n'idi uku nke Chineke bu ihe na-akowaputa nweda onwe anyi n'ala kpam kpamnyeya.

AMAOKWU IBU N'UCHE: Opupu 15:11 "Onye di ka gi n'etiti chi nile, Jehova? Onye di ka Gi, di ebube n'idi-nso? Onye ana-atu egwu n'olulo nile, n'eme ihe ebube di iche iche".

 

2022 Igbo Anglican Bible Study - Study 7 to Study 10 (2022 CON Bible Study)

 

Study 8 February 20, 2022 (IHE OMUMU NKE ASATO)

SEXA JESIMA SONDE (Sonde nke Abuo tutu Lenti Erue)


ISIOKWU NCHIKOTA: Onyenweanyi Chineke na Ochichi nke udo

 NKEBI ISIOKWU: Omuma Chineke nke onye nke Kraist

ISIOKWU: Chineke bu Nmalite (Alfa) nke ihe nile.

EBE AGA AGU: Aizaya 4:1 -4


EBUMN'OBIIHE OMUMU A:

i. Ka akowa ihe ahiriokwu a bu "Onye nmalite (Alfa) nke ihe nile" nakwa;

ii. Ka akowa n'uba otu Chineke si gosiputa onwe Ya dika Onye Nmalite nke ihe nile (Alfa)

OKWU NKOWA: Amaokwu nke ano n'ebe anyi guru ihe ogugu nke taa kpughere Chineke dika onye kpoputara ogbo nile site na nmalite. O nwere ike mee nke a n'ihi na Ya onwe Ya bu Nmalite. Onori n'ogbo nile mbu gara aga, o ga na anokwa rue nkwusi ogbo nile ndia. N'ezie aha ya bu "Agbawe Agbawe". O bu onyenwanyi ebighebi na mba nile na ogbo nile, n'ezie odighi mba obula n'uwa inwere ikikere ichikwata odiniru ha. Chineke kpughere site n'onu onye amuma Aizaya, na nmalite na idozi ihe nile n'usoro, ya na odin'iru mba nke mba nile bu ihe di naka Chineke. Nke a ka Chineke gosiputara n'ime ndu Sairos site na nmeri agha ya nile ya na otu Chineke jiri were Sairos zoputa umu Izrel na ndoro na-agha nke ndi Babilon dooro ha nwee si otua meputa n'ozuzu oke ezi atumatu nke Chineke n'elu uwa, obu ezie n'obu Empero nke na-adighi efe Chineke. Anyi nwere ike igu Deut 32:8 nakwa Olu Ndi Ozi 17:26. Inabata na nkwenye site na nnukwu njirimara Chineke anyi kwesiri ka anyi na-akwenyere Ya ezi ugwu na Nsopuru ma n'efe ya ofufemgbenile.



IHE  OMUME:

1.  Kedu ka isi ghota isiokwu a na "Chineke Bu Nmalite (Alfa) ihe nile" dika o di na n'ebe anyi guru ihe ogugu? Lekwuo anya na Aizaya 43:10; 44:6-7, Nkpughel:17

2.  Site n'ebe ndia aga-agu, kowaa otu Chineke jiri gosiputa na ya bu Nmalite (Alfa) ihe nile Jen 1:13, Aizaya 46:10; 2 Tesalonaika 2:13.


3. Kpoputa uzo di iche iche nke ufodu mmadu n'ime akwukwo siri nye Chineke oghere onodu mbu n'oge nke ha, nakwa otu anyi nwere ike ime otu a n'ubochi nke anyi taa Jen 4:3- 4; 1 Sam 23:2-5; Mak 1:35; 1 Ndi Korint 16:2

4.  Kedu ka anyi ga eji nye Chineke ohere na onodu mbu karisia igosiputa ya site n'ihe anyi kwere? Olu Ndi Ozi l:2-3; Kolosi 1:12; 16-18.


OKWU NCHIKOTA: Odighi ihe obula di tutu Chineke adi. O bu ya bu "Nmalite (Alfa) nke ihe nile" o bu Ya bu Ekwusie Agwu na nmalite mgbe ochie. Okwesiri ka enye nani ya onodu mbu kachasi nma n'ime ndu anyi. Anyi agaghi, anyi apughikwa inye Ya onodu ozo na abughi nke mbu n'ime ndu anyi dika ndi nke Kraist.


OKWU NKE NTUGHARI UCHE: Enyeghi Chineke onodu mbu na ndu anyi bu nnukwu oghom.


AMA OKWU IBU N'UCHE: Ndi Kolosi 1:18 "Ya onwe Ya bukwa isi aru, nke bu nzuko Ya ebe obu onye nmalite, onye eburu uzo muo site na ndi nwuru anwu ka enwe me ka Ya onwe Ya buru onye mbu n'ihe nile"


2022 Igbo Anglican Bible Study - Study 7 to study 10 (2022 CON Bible Study)


Study 9 February 27, 2022  (IHE OMUMU NKE ITEGHETE)

Sonde akporo Quinquajesima  (Sonde nke Ikpe-azu Tutu Lenti Erue)

ISIOKWU NCHIKOTA: Onyenweanyi Chineke na Ochichi nke udo

NKEBI ISIOKWU: Omuina Chineke nke onye nke Kraist

ISIOKWU: Chineke onye na-ano n'ebe nile na namgbe nile (Ominiprezent)

EBE AGAAGU: Abuoma 139:7-12

 

EBUM N'OBI IHE OMUMU A:

i. Ka enyere anyi aka ighota ihe o putara na Chineke no n'ebe nile n'otu mgbe.

ii.FCa echetara anyi na anyi enweghi ike izonari onwe anyi n'ebe Chineke no na-agbagheghi otu obula anyi si chekwaa ihe emere na nzuzo anyi apughikwa igbapu n'iru Ya n'ubochi nguko ha nile nke mmadumere.


OKWU NKOWA:

Dika anyi na-anbata ndi otu Kraist nile n'uka nke ikpeazu tutu Lenti erue, nke akporo Quinquajesima Sonde, ka Chineke nye anyi nile amara mgbe nile iga ije n'uzo Ya nile na aha Jisos, Ihe nghota di n!isi okwu nke taa bu "Chineke onye no n'ebe nile na mgbe nile" negosi na akara omume n'egosi na Chineke no n'ebe nile mere ka anyi kwere na ono n'ebe nile n'oge nile ma nwekwaa ike iza oku inyere aka na nnaputa mmadu nile n'otu mgbe n'ebe nile nakwa n'oge nile. Ozokwa. nkea putara dika ina azopu ukwu ime njem obula, na Ya onwe Ya nonyere Gi mana opupu gi, ma n'iru gi ma na-azu gi rue mgbe I ga era ebe obula 1 na-aga.

Nkea mere na site na nnukwu nsopuru onye Abuoma nwere nye udi akparamagwa nke Chineke jiri kwenye ma kwusie Ya ike na Ya onwe. Ya maobu onye obula ozo apughi igbanari maobu zonari onwe Ya n'ebe Chineke no, maobu n'ugwu maobu na ndida.

 

IHE OMUME

1. Site n'ebe anyi guru na Abuoma 139:7-12 inwere ike irutu aka na arnaokwu nke kowara nkebi ahiriokwu a bu "Ino n'ebe nile mgbe nile"? Odighi ka enwere ihe obula ozo ekere eke nwere udi akara Chineke nwere? Lekwuo anya na Ndi Hibru 4:13

2.  . Na nkowa uju itunanya onye Abuoma gosiputara na Abuoma 139:7- 12, odighi ka obu ihe kwere oimune na mmadu ga-ezonariwu onwe ya n'ebe Chineke no? Nwere otutu ihe ima atu kparita uka maka nkea.

3.  Jiri Jona 1:3-4, 14,_17; 2:1 nakwa Olu Ndi Ozi 16:25-26 kowaa nye ndi nke Kraist aicara omume Chineke bu "1 no n'ebe nile" nwee nye ndi nke Karist nile n'ime onodu ha di iche iche.

4. Kedu ntarama ahuhu n'echere ndi nile na-aga n'iru n'eme omume maobu akpa agwa dika aga-asi na Chineke enweghi ike ihu ihe ojoo ha ha n'eme n'ebe ha kporo ebe nzuko ha? Ilu 15:3, N kpughe 6:15:17

 

OKWU NCHIKOTA: O bu eziokwu na Chineke no n'ebe nile n'oge nile. Nke a kwesiri ibu ihe nkasiobi nye ndi nile kwere ekwe ka ha mara na ha no na ezi nchekwa nke Chineke n'ebe obula ha na-aga. N'otu aka ahukwa, o dighikwa ajo mmadu obula nwere ike igbani ikpe nke chineke n'ihi na ha apughi izonari ihe ojoo ha nile n'ebe Chineke no. OKWU NKE

 

NTUGHARI UCHE: Obu nani onye nzuzu na asi na onwere ike izonari onwe ya n'ebe chineke no.

 

AMAOKWU IBU N'UCHE: Ndi Hibru 4:13 "Odighikwa ihe ekere eke nke na-aputaghi ihe n'iru Ya, kama ihe gba oto burukwa ihe emegheworo n'anya Ya bu onye anyi ga-akoro akuko banyere omume anyi.



2022 Igbo Anglican Bible Study - Study 7 to Study 10 (2022 CON Bible Study)

Study 10 March 6, 2022  (IHE OMUMU NKE IRI)

Sonde nke mbu n'ime Lenti 


ISIOKWU NCHIKOTA: Onyenweanyi Chineke na Ochichi nke udo

NKEBI ISIOKWU: Omuma Chineke nke onye nke Kraist

ISIOKWU: Ngwusi ihe nile - Ikpeazu (Ornega)

EBEAGAAGU:Aizaya 46:3-13

EBUM N'OBI IHE OMUMU A:

i. Ka akowa ihe okwu a bu ikpeazu (Omega) putara n'ime akwukwo Nso Yana:

ii. Ka anyi wee nghota na Chineke bu ikpeazu ihe nile.



OKWU NKOWA:


Na nghota nke mmadu mkpuruokwu a bu "Omega" bu mkpuruokwu nke ikpeazu n'usoro mkpuruokwu nke ndi 'Grik' bu nke n'egosiputa n'isi ngwusi, maobu "akuko nke ikpeazu". Nkea putara na mgbe obula Onyenweanyi kwuputara na Ya onwe Ya bu "IKPEAZU", o putara na obuna mgbe ihe ozo ekere eke kwusiri idi kpam kpam, na Chineke na-aga n'iru na adi ndu. N'akwukwo Aizaya 46:10, e gosiri na obu nani Chineke n'eme ka amara ngwusi ihe nile site na nmalite ya sitekwa na mgbe ochie gara rukwaa n'odiniru na-abia. Ya mere ebumnobi Ya n'eguzosike Apughikwa igbagha ya. 


Nani Ya nwere ike imeputa ma chekwaa ihe nile nke okpuru, Ya onwe Ya nwekwara ike ime ka atumatu Ya nile bia na nmezu. Ebe anyi guru taa mukwasiri ihe ya n'eziokwu a na Chineke anyi anowori n'ogwugwu ihe nile anyi na-agabiga na ndua dika umu ya. Ya mere kedu ka anyi g'esi kporie ndu kasi nma di n'iru dika ndi nke kraist?



IHEOMUME

1.   Kowa okwua bu "IKPEAZU" (omega) na nghota gi na dika Aizaya 46:10 siri kowaa ya.

2.   Kparitaukanankwenye nke onwe nke Chineke dika "Ikpeazu". Nwere Nkpughe 1:8 tunyere Aizaya 46:10; Nkpughe 1:8; 22:12,13

3.  Site n'ime akwukwo Nso nakwa n'ihe n'eme na gburugburu anyi taa, Chineke dika onye Ikpeazu n'ezie n'ime nmeme obula anyi n'eme. Kowaa Chineke dika onye Ikpeazu n'ezie n'ime nmeme obula dika anyin'eme. Jen 45:6-8, Job 42:12; Matiu 28:19-20

4. Site n'ihe omumu anyi taa ya na nghota di na Job 19:25-27 na Jon 3:16-17, Gini bu olileanya ebighebi nke ndi otu Kraist nile nwere.


OKWU NTUGHARIUCHE: Ihe nile obula jedebere n'ime Ya, onye bu Njedebe n'onwe Ya.


AMAOKWU IBU N'UCHE: Aizaya 46:9 "Chetanu ihe mbu nile site na mgbe ebighiebi gara aga n'ihi na mu onwe m bu Chineke. Odighikwa onye mu onwem.

Post a Comment (0)
Previous Post Next Post