Abu 182- Jisus, Enyi nke obim

Abu 182- Jisus, Enyi nke obim

 Abu 182- Jisus, Enyi nke obim

Abu 182- Jisus, Enyi nke obim

Abu 182- Jisus, Enyi nke obim


Verse 1

Jisus, Enyi nke obim,

Ka m'gbaba n'okpuru Gi,

Mgb'osimiri nebili,

Mgb'ifufe nefes'ike.


Onye-nzọputam, zobem

K'ifufe ndu a gabiga;

Duum ga n'ala udo,

Biko, nara nkpur'obim.


Verse 2

Enweghm ebe-ngbab'ozo,

Obim koro n'aru-Gi;

Biko, arapukwalam,

Kwagidem, kasiem obi.


Gi bu ntukwasi-obim,

Nani I nenyerem aka;

Biko, were udo nku-Gi

Kpuchie isi-oto nkem.


Verse 3

Ihe nile nke m'nachọ,

Kraist ahuzuwom na Gi;

Palitem, kasiem obi,

Gwo oriam, du ony'isi.


Aha-Gi bu aha nsọ,

Ejurum n'aj'omume;

Aghugho di nim'obim,

I juru n'ezi-okwu.


Verse 4

Amara-Gi di ukwu,

Ọ gekpuchi njom nile;

Me ka miri-ogwugwo

Sacham, debe kwam ọcha.


Gi bu is'iyi nke ndu,

Ka m'nara miri n'efu;

Suputa nime obim

Rue na ndu ebigh-ebi. Amen.

Abu 182- Jisus, Enyi nke obim

Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.


We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.

.Site Credit: 9jainformed.com



Post a Comment (0)
Previous Post Next Post