Abu 60- Onye-nzọputam biara Betlehem.

Abu 60- Onye-nzọputam biara Betlehem.

 Abu 60- Onye-nzọputam biara Betlehem.


 

Verse 1

Onye-nzọputam biara Betlehem,

Amuru Ya n'ulo anumanu;

Ọ bu ih'ebube-Onye-ngọzi!

Ọ bu mu k'Ọ nachọ.


Kọrọs:-

Mu k'Ọ nachọ! nachọ!

Mu k'Ọ nachọ! nachọ!

Ọ bu ih'ebube-Onye ngọzi!

Ọ bu mu k'Ọ nachọ.


Verse 2

N'obe ka Jisus, Onye-nzọputam,

Kwur'ugwom dum, gbaputa nkpur'obim;

Ọ bu ih'ebube-Onye-ngọzi!

Nwuru onwu n'ihim.


Mu k'Ọ nwuru! nwuru

Mu k'Ọ nwuru! nwuru!

Ọ bu ih'ebube-Onye-ngọzi!

Nwuru onwu n'ihim.


Verse 3

Onye-nzọputam di k'Ọ din a mbu;

Mgbe m'rapuru uzọ nefughari-obim,

Nakpom oku! nakpom!


Mu k'Ọ nakpo! nakpo!

Mu k'Ọ nakpo! nakpo!

Ọ ji nwayọ nario nkpuru-obim,

Nakpom oku! nakpom!


Verse 4

Onye-nzọputam gesi n'elu bia-

Nkwa di utọ k'aro nagabiga!

Agamahu Ya k'Ọ naridata.

Mgb'Ọ gabia iwerem!


Ọ gabi iwerem!

Ọ gabi iwerem!

Agamahu Ya k'Ọ naridata,

Mgb'Ọ gabia iwerem! Amen.

 Abu 60- Onye-nzọputam biara Betlehem.

Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.


We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.

.Site Credit: 9jainformed.com

Post a Comment (0)
Previous Post Next Post