Abu 189- Ekesiworom dum nile

Abu 189- Ekesiworom dum nile

 Abu 189- Ekesiworom dum nile

Abu 189- Ekesiworom dum nile

Abu 189- Ekesiworom dum nile


Verse 1

Ekesiworom dum nile!

Nna, nka ka m'matara;

Ngbanwe dum nke naghagh ibia,

Atughkwam egwu ha;

Nyem obi um'ala ugbu a,

Nk'ihe-ya nato Gi.


Verse 2

Nyem ihu-n'anya nwer'uche,

Site n'amam-ihe;

Ka m'wer'ochi onu naga,

Hicha kw'anya-miri;

Na nkpur'obi nke no n'udo

Ikasi ndi ozo.


Verse 3

Achokwaghm uche nke nadigh-

Enwe izu-ike;

Nke nachọ ime ih'ukwu,

N'imat'ihe-nzuzọ.

Mesom dika nwatakiri,

Nedum n'uzọ m'naga.


Verse 4

N'eb'o bula m'gano n'uwa,

N'onodu o bula,

Aghaghm isoro ndi ozo

Nwe nmeko nke obi;

Lu-kwa-ra Ya, Onye n'nefe,

Olu nk'ihu-n'anya.


Verse 5

Nyem ike ubọchi nile,

Nk'I nenye ora dum;

N'uche iji di ndu n'uwa,

Ma nodu n'akuku-I;

Ọ zuworom ino nwayọ,

Nenye Gi otuto.


Verse 6

Ije-ozi si n'ochicho-I

Adigh ekem agbu;

Obim namuta ezi'okwu

Nke natop'umu-Gi:

Na ndu nk'iju onwem aju

Bu ndu inwer'onwem! Amen.

Abu 189- Ekesiworom dum nile

Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.


We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.

.Site Credit: 9jainformed.com



Post a Comment (0)
Previous Post Next Post