Abu 52- Lenu Jisus! kiribenu!
Verse 1
Lenu Jisus! kiribenu!
O si n'agha naputa;
O meriwo ndi-iro-Ya,
Ka ora da n'ukwu-Ya.
Kọrọs:-
Me Ya Eze! Me Ya Eze!
Eze nke nd'eze nile.
Verse 2
Ndi-mọ-ozi, me Ya Eze!
Le ok’ih’Ọ lutara;
Dobe Ya n’och’eze elu,
Ka el’igwe nanuri.
Verse 3
Ndi-njọ kpube Ya okp'ogwu,
Me Y’eze n’ikwa emo;
Ndi-nsọ na ndi-m’ozi nile
Me Ya Eze ebube.
Verse 4
Nu olu nke oke ọnu!
Ge nti n’ol’ubọ nmeri!
N’ebe nke kachasi elu
Ka Jisus nọ ka Eze. Amen.
Abu 52- Lenu Jisus! kiribenu!
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com