Abu 99- Nna, ayi zukot'ozo n'aha Jisus.

Abu 99- Nna, ayi zukot'ozo n'aha Jisus.

 Abu 99- Nna, ayi zukot'ozo n'aha Jisus.
 

Verse 1

Nna, ayi zukot'ozo n'aha Jisus,

Kpo isi ala nye I na ncheghari;

Ayi weli'ozo olu nadigh ike,

Nario ebere, nabu otuto-I.


Verse 2

Ayi gagozi ncheb'ebigh-ebi-Gi,

Nekwuputa olu-Gi kw'ubọchi;

Ejigh ebere-I nekpube ndu-ayi?

Ọ bugh aka-I gbar'ayi gburugburu?


Verse 3

Ewo ! ayi ekwesigh ihu-n'anya-I;

Otutọ mgbe k'ukwu-ayi fur'efu !

M'ugbu a, n'ih'olu-Gi nagb'ayi ume,

Ayi nd-njọ lata n'ulo-Gi ka Nna.


Verse 4

N'ih'Aha nk'ozuzu bi nime Ya,

Site n'ihu-n'anya nke kachasi,

N'Obara nk'awusiri n'ihi njọ,

Meghe uzọ ebere kpobat'ayi !  Amen.

Abu 99- Nna, ayi zukot'ozo n'aha Jisus.

Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.


We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.

.Site Credit: 9jainformed.com

Post a Comment (0)
Previous Post Next Post