Anglican Bible Study Igbo - Study 4, January 23, 2022 (IHE OMUMU NKE ANO)

Anglican Bible Study Igbo - Study 4, January 23, 2022 (IHE OMUMU NKE ANO)

Anglican Bible Study Igbo - Study 4, January 23, 2022 

IHE OMUMU NKE ANO (Study 4).  Anglican Bible Study Igbo - Study 4, January 23, 2022. 

Sonde nke Ato ka Epifani gasiri   JENUWARI 23, 2022


ISIOKWUNCHIKOTA:    Onyenweanyi Chineke na Ochichi nke udo.

NKEBIISIOKWU:    Uzo nkpughe nke Chineke Nye umu mmadu. 

ISIOKWU:          Nzikorita ozi onu okwu di n'etiti mmadu na Chineke.

EBEAGAAGU:    1 Sam3:8-14


EBUM N'OBI IHE OMUMUA

i. Ka akparita uka n'uzo na nzikorita ozi onu di n'etiti mmadu na Chineke dika odi n'ime Akwukwo Nso.

ii..Ka ekpughee otutu ihe ngbado ukwu nke enyere mmadu aka inu olu chineke.


OKWU NKOWA: 

Nzikorita ozi onu okwu putara ikwukorita okwu onu nke a na esite n'ime ya nyefee ozi di rnkpa site n'otutu okwu. Enwere otu ebe igba ama di iche iche n'akwukwo Nso na-akowa na Chineke na agwa ndi nke ya okwu site na nkparita uka. N'ebe ngbado ukwu ihe ogugu anyi, anyi huru na Chineke kwuru anu aru nkeoma nye Samuel mana oghutahiere nkwuwa okwu nke chineke wee chee na obu Eli, onye amuma n'ekwu (mmadu na mmadu).

Na-agbanyeghi nkea Samuel jisike wee nata ozi nke Chineke na nzute nke ato (1 Sam 3:10-14). Na nkparita uka anyi nke taa, anyi ga-ahuta na enwere otutu ezi ntoala nke n'eme ka nzikorita ozi n'etiti mmadu na Chineke burn igba nke ibi ndu di nso mgbe niile bu otu n'ime ha.


IHE OMUME:

1. .Kowa ihe nzikorita ozi okwu onu nke Chineke na umu mmadu bu di
ka o di n'ebe anyi guru taa na kwa Opupu 3:13-14.

2.    Gini mere na Eli enwenwughi ike inu oku Chineke kporo? Nwene 1
Sam 2:27-30 nakwa 3:13-14 wee kowaa ya. Nwere tunyere ebe ndia:
Roml:28;Kor2:14.


3.    Kedu ihe ngbado ukwu eji anu olu chineke dika odi na 1 Sam 2:11,
18,;3:la;Abuoma24:3-4;Mkl:35.

4. Obu ezie na Chineke ka na agwa ndi mmadu okwu n'ogbo anyi taa? Obu "ee" kowaa site na nweputa nke onwe. Oburu "ee", Gini kpatara ya?


OKWU NCHIKOTA: 

Chineke nosike ebighiebi n'olu nke nzukorita ozi nye ndi nke ya n'uzo ana-anu nke oma, otu osi na di, anyi kwesiri ino ya nso mgbe nile site n'ekpere, na itughari uche n'okwu ya nakwa site n'ibi ndu ezi omume wee nwe ike mara olu nke Chineke na nke bu olu nke ekwensu.

OKWU NKE NTUGHARI UCHE: Njikere anyi di n'ibiaru Chineke Nso, N'egosi njikere anyi di na inu olu ya.                                                                                                                                                                              

AMA OKWU IBU N'UCHE: 1 Sam 3:10 "Jehova wee bia guzo onwe ya, kpoo oku dika o kporo na mgbe mbu si "Samuel, Smauel wee si, "Kwue n'ihi na oru gi na-anu".


Anglican Bible Study Igbo - Study 4, January 23, 2022 (IHE OMUMU NKE ANO)


Anglican Bible Study Igbo - Study 4, January 23, 2022 (IHE OMUMU NKE ANO)

Post a Comment (0)
Previous Post Next Post