Abu 114- Ugbu a, Nna , necheta ihu-n'anya.

Abu 114- Ugbu a, Nna , necheta ihu-n'anya.

 Abu 114- Ugbu a, Nna , necheta ihu-n'anya.



Verse 1

Ugbu a, Nna , necheta ihu-n'anya

Nke gbatar'ayi n'obe nke Kalvari;

Eb'Onye narior'ayi nanonyer'ayi,


Ayi nagbasa, niche kwa n'iru Gi

Aj'ahu zur'oke n'anya nke-Gi,

Ezi aja nadigide mgbe dum.


Verse 2

Nna, le iru-Ya etere manu,

Le kw'ayi dika nd'ahuru nime Ya;

Elekwala nleli amara-Gi,


Ekpere n'okwukwe-ayi jur'oyi:

N'etiti nmehie-ayi n'ugw'olu-ha

Ayi debere ahuhu nk'Onye-nw'ayi.


Verse 3

N'ihi ndi nile ayi huru n'anya,

Site na Nnonye uku k'ayi nario:

Makuaha nsọ n'obi-ebere-Gi,


Me k'ike-I ra n'ihi nkpur'obi-ha;

Site na ntupo njọ debe h'ọcha,

Werike nmeri kpukwas'onyinye-I.


Verse 4

Ayi abia; dorue ayi nsọ n'ukwu-Gi,

Onye-nzọputa nahu ayi n'anya;

Site na nri utọ nka di egwu


Doput'ayi na nmetu-aka njọ dum;

Me k'ayi nwe onu n'ije-ozi-Gi,

Ghar'ikewapu na Gi mgb'o bula. Amen.

Abu 114- Ugbu a, Nna , necheta ihu-n'anya.

Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.


We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.

.Site Credit: 9jainformed.com


Post a Comment (0)
Previous Post Next Post