Abu 120- N'abal'ahu k'arara Ya.

Abu 120- N'abal'ahu k'arara Ya.

 Abu 120- N'abal'ahu k'arara Ya.


 


Verse 1

N'abal'ahu k'arara Ya

Nye n'aka iwe nd'iro dum,

Ka Onye-nzọputa uwa

Ji nara ogbe achicha.


Verse 2

Mgb'Ọ nyesiri Ya ekele,

Bu Onye nwe uwa n'igwé.

Ọ nyaw'ih'atu nk'aru-Ya,

Nye ndi nes'uzọ-Ya, nasi:-


Verse 3

“Arum nke anyawara nye

N'ih'unu, nara, rie, di ndu:

Mgbe nile unu geme ya,

Necheta ihu-n'anya nkem.”


Verse 4

Ọ nara iko n'aka-Ya,

Nye Chuku otuto ozo;

K'omiko nenwu n'obi-Ya,

Nzọputa si n'onwu-Ya bia.


Verse 5

“Obara nkem k'awusiri

K'o sacha obi nke nmehie;

Ogbugba-ndu nka gosiri

Amar'ebigh-ebi nk'igwé.


Verse 6

Ihu-n'anya jur'iko nka,

K'ora nua manya nsọ ahu;

Nanunu ya n'ogbo nile,

Necheta oge onwu nkem.” Amen.

Abu 120- N'abal'ahu k'arara Ya.

Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.


We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.

.Site Credit: 9jainformed.com


Post a Comment (0)
Previous Post Next Post