Abu 129- Jisus, gwam okwu, ka m'were.

Abu 129- Jisus, gwam okwu, ka m'were.

 Abu 129- Jisus, gwam okwu, ka m'were.


 
Verse 1

Jisus, gwam okwu, ka m'were
Olu di ndu kwuputa ya;
Ka m'cho kwa, otu I choro,
Umu-Gi ndi furu efu.

Verse 2


Nedum, Jisus, ka m'nedu kwa
Ukwu ndi nke nawaghari;
Nazum, Jisus, ka n'were kwa
Manna zuz ndi agu nagu.

Verse 3


Nyem ike'k'ebe m'neguzọ
N'elu Nkume, d'ike na Gi,
M'geseti ak'ihu-n'anya
Nye ndi nagba ngba n'ahuhu.

Verse 4


Ziem ihe, Jisus, ka m'zi kwa
Ih'ok'onu I gosiri;
Nye okwum nku ka ha feba
N'ebe-nzuzọ nk'obi nile.

Verse 5


Nyem izu ike utọ-Gi.
Ka m'wer'ike nkasi-obi
Kwuru Gi okwu kwesiri
Nye nd'ike gwuru n'oge nkpa.

Verse 6


Jisus, mejuem n'ozuzu-Gi,
Rue mgbe obim gejuputa
N'okwu n'echiche nenw'enwu,
Ito Gi, ko ihu-n'anya-I.

Verse 7


Werem, Jisus, ma werekwam,
Ka m'nej'ozi-Gi k'I si cho;
Rue mgbe m'gahu iru ngọzi-I,
Ket'iz'ike n'otuto-Gi. Amen.

Abu 129- Jisus, gwam okwu, ka m'were.

Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.


We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.

.Site Credit: 9jainformed.com

Post a Comment (0)
Previous Post Next Post