Abu 133- Njiko nke di ngọzi.

Abu 133- Njiko nke di ngọzi.

 Abu 133- Njiko nke di ngọzi.


 

Verse 1

Njiko nke di ngọzi

N'ihu-n'anya Jisus!

Idi-n'otu nke obi-ayi

Yiri nke di n'elu.


Verse 2

N'iruoch'eze Nna

Ayi nekpe ekpere;

Ochich'ayi, nkasi, nkpa, n'egwu,

N'olil'any'ayi b'otu.


Verse 3

Ayi nweko ahuhu,

Neburit'ibu-ayi;

Ihe newuta ot'onye

Gewuta ibe-ya.


Verse 4

Mgbe nwoke na nwanyi

Nekwe nkwa n'iru nna

Na ha gebi n'ihu-n'anya

Rue mgb'onwu gekewa:


Verse 5

Ọ bu nkwa nke di nsọ,

Di kwa ike n'ezie;

Ekwela k'ihe o bula

Me k'i jehie na ya.


Verse 6

Tukwasi Kraist obi,

Wepu uche uwa;

Ọ mawo adigh-ike-gi,

Ọ genyere i aka.


Verse 7

Mgb'ayi gapu n'ihé-ngbu,

N'olu na nmehie-ayi,

Ayi gebi n'ez'ihu-n'anya

Rue mgbe ebigh-ebi. Amen.

Abu 133- Njiko nke di ngọzi.

Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.


We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.

.Site Credit: 9jainformed.com

Post a Comment (0)
Previous Post Next Post