Abu 135- Chuku, Nna, Ony'okike

Abu 135- Chuku, Nna, Ony'okike

 Abu 135- Chuku, Nna, Ony'okike


 

Verse 1


Chuku, Nna, Ony'okike,

Onye j'ihu-n'anya

Jiko ndu abua n'otu

Nim'ogige iden:

Wer'onyinye-Gi ochie

Nye umu-Gi ndia ta:-

Ulo ebe onu di,

N'ezi ihu-n'anya.


Verse 2

Jisus, Obia nenyezu

Dika na Galili,

Biko, nonyere ndia ta,

Bu ndi nakpoku Gi;

Mọ k'onu-ha nke uwa

Gho manya nk'el'igwé;

Zi ha mgbe ha nanu ya

N'onyinye bu nke-Gi.


Verse 3

Mọ nke Nna, si n'el'igwé

Kukwasi ha ume;

Idi-ọcha-Gi d'ike,

Ihu-n'anya-I di nro.

K'iru-Gi nechebe ha

Site na njọ n'ogu;

Bur'onye-ndu nke ndu-ha,

N'Eze nim'obi-ha.


Verse 4

Nna, mgbe I newugh ulo,

Owuw'ulo b'efu;

Jisus, mgb'i nazozigh ya,

Onu gagh'ihe-ngbu.

Ọ digh ihe gekewa

Ndi I jikotara;

Ihu-n'anya Mọ doro

Nsọ enwegh ogwugwu. Amen.

Abu 135- Chuku, Nna, Ony'okike


Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.


We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.

.Site Credit: 9jainformed.com

Post a Comment (0)
Previous Post Next Post