Abu 152- To Chuku Abraham.

Abu 152- To Chuku Abraham.

 Abu 152- To Chuku Abraham.

Abu 152- To Chuku Abraham.
Abu 152- To Chuku Abraham.


Verse 1

To Chuku Abraham,

Bu Eze n'el'igwé,

Onye si na mgb'ebigh-ebi,

Nn'ihu-n'anya:

Chuku, ABUM di'uku,

Nk'uwa n'igwé neto:

Ka m'rub'isi gozie Aha-I

Di nsọ mgbe dum.


Verse 2

To Chuku Abraham,

Onye nyere iwu,

M'we si n'aja bilie ch'onu

N'aka-nri-Ya.

Ajum ih'uwa dum,

Ike n'amam-ihe;

Nani ya bu okem n'otam,

Ulo-elum.


Verse 3

Adaberem n'iyi

Ọ ji Onwe-Ya nua;

Agamewere nku ugo

Rigo n'igwé.

M'gahu iru nsọ-Ya

Neto kw ike-Ya,

Bua abu nye amara-Ya

Rue mgbe nile.


Verse 4

Ma ike uwa gwu,

Oku-mo megidem,

N'ala Kenan ka m'ga ije

Dik'Ọ si kwu;

Gafe osimiri,

Nele Jisus anya,

Si n'ozara nekpo oku

Naga n'iru.


Verse 5

Kal'ọma ka m'nahu,

Nk'udo n'iju-afo;

Ala nk'inwe-onwem di nsọ,

Na iz'ike.

Manu-anu neru,

Manu ba-kwa-r'uba;

Osisi-ndu neto mgbe dum

Nim'ebere.


Verse 6

Ez'ayi bi n'eb'ahu,

Ony'ezi'omume-ayi,

Nemeri uwa na nmehie,

Eze udo.

N'ugwu nsọ nke Zaion

K'al'eze-Ya di kwa;

Ya na ndi nsọ-Ya nim'ihe

Nabu eze.


Verse 7

Ọ nedebe ndi-Ya,

Chebe ha na nsọYa,

Neyikwasi uwe ọcha

Nwuny'ohu-Ya,

Iyi nke onu nsọ,

obi'utọ nke di ndu,

Nkpuru ọma nke Paradais,

K'Ọ nenye ha.


Verse 8

Chuku nke bi n'elu

Ka ndi-m'ozi neto,

Nasi “Nsọ! Nsọ! Nsọ!

Eze d'ike!”

“Onye nori, no kwa,

Ọ gano mgbe nile;

Chineke, Nna, ABUM di'uku,

Ayi nefe Gi!”


Verse 9

N'ir'Onye-nzọputa

Nd'agbaputara no,

Neti nkpu n'amara nke-Ya,

Ohu mgbe dum.

Ọ gos'ihu-n'anya,

Obi-ha kpo oku,

Olu-ha dazue n'uwa dum,

“Nwa-aturu!”


Verse 10

Usu nmeri nile

Neto Ya, “Ekele!

Nna na Ọkpara na Ma Nsọ!”

Mgb'ebigh-ebi.

“Ekele, Chinekem!”

Ka m'so n'abu nk'igwé;

“Ike, n'ebube, n'otuto

Bu nke-I mgbe dum!” Amen.

Abu 152- To Chuku Abraham.

Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.


We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.

.Site Credit: 9jainformed.com

Post a Comment (0)
Previous Post Next Post