Abu 156 - Tob'Eze nke ni n'otuto n'elu.

Abu 156 - Tob'Eze nke ni n'otuto n'elu.

 Abu 156 - Tob'Eze nke ni n'otuto n'elu.


 

Abu 156 - Tob'Eze nke ni n'otuto n'elu.
Abu 156 - Tob'Eze nke ni n'otuto n'elu.

Verse 1

Tob'Eze nke ni n'otuto n'elu,

Bua abu nk'ike n'ihu-n'anya-Ya:

Ota n'Inye-ak'ayi, Ony'ochie k'Ọ bu,

Onye bin'ebube, nkeyir'otuto!


Verse 2

Ko amara-Ya, bu kwa ike-Ya,

Uwe-Ya b'ihe, ulo-Ya b'igwé;

Ugb'ala iwe-Ya nwer'igw'oji,

Uz'ochichiri-Ya di nim'ifufe.


Verse 3

Chuku, ike-Gi ker'uwa mgb'ochie,

N'ih'ebube dum di kwa nimw ya;

I ji ezi'ukpuru we kwagide ya,

Osimiri k'I ji yibe ya k'uwe.


Verse 4

Nchebe-Gi nile, onye pur'iko?

Ume ayi neku, ihe nke nenwu!

Ọ sitere n'ugwu rudata n'ala,

Wusa igirigi na mir'ozuzuo.


Verse 5

Umu nke aja, ndi nadigh ike,

Ayi dabere Gi, na I kwesiri!

Eber'obi-nro-Gi di mgb'ebigh-ebi,

Eyi, Ony'okike, n'Onye-ngbaput'ayi!


Verse 6

Ihu-n'any'ukwu! Ike kachasi!

Ebe ndi-m'ozi neto Gi n'elu,

Ayi ndi bi nim'uwa, n'ezi nsọpuru,

Geji olu nwayọ nabu otuto-I! Amen.


Abu 156- Tob'Eze nke ni n'otuto n'elu.

Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.


We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.

.Site Credit: 9jainformed.com

Post a Comment (0)
Previous Post Next Post