Abu 167- To Chineke, Ony'okike, Eze nk'uwa nile

Abu 167- To Chineke, Ony'okike, Eze nk'uwa nile

 Abu 167- To Chineke, Ony'okike, Eze nk'uwa nile

Abu 167- To Chineke, Ony'okike, Eze nk'uwa nile
Abu 167- To Chineke, Ony'okike, Eze nk'uwa nile


 

Verse 1

To Chineke, Ony'okike, Eze nk'uwa nile;

Obim, to Ya, n'ihi na Ya bu ndu na nzọputa-i;

Ndi nke nanu,

Ndikom na ndinyom bia nsọ,

Wer'obi'utọ sopuru Ya.


Verse 2

To Chineke, Nke nechebe gi, gozi kw'olu-gi;

Obi'ọma n'ebere-Ya nechere gi kw'ubọchi;

Tule y'ozo,

Ihe Ọ puru ime

M'Ọ hu gi n'anya dik'Eyi.


Verse 3

To Chineke, Nke ji ebube nach'ihe nile;

Negbochiri i  ihe'ize-ndu, natute obi-gi;

I kalugh kwa

K'esi me ochiho-gi

N'ihe nk'Ọ bur'uzọ dozi?


Verse 4

To Chineke, Onye, mgb'ọchichi na njọ bar'uba,

Mgbe ndi nemeb'iwu nachọ imeri ndi-ọma,

Nezisi'ihe,

Nachu ogwu abali,

Nemere ndi-Ya ebere.


Verse 5

To Chineke! k'ihe nile nimem sopuru Ya!

K'ihe dum nek'ume wer'otuto bia n'iru Ya!

K'Amen nada

N'onu ndi nsọ-Ya ozo:

K'ayi to Ya n'onu mgbe nile. Amen.

Abu 167- To Chineke, Ony'okike, Eze nk'uwa nile

Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.


We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.

.Site Credit: 9jainformed.com

Post a Comment (0)
Previous Post Next Post