Abu 393- Gini k'umu-nta genye

Abu 393- Gini k'umu-nta genye

 Abu 393- Gini k'umu-nta genye  

Abu 393- Gini k'umu-nta genye
 Abu 393- Gini k'umu-nta genye  


Verse 1 

Gini k'umu-nta genye 

Onye-nw'ayi Kraist Jisus ta, 

N'ihi ebere-Ya dum, 

N'ihi ngozi O nenye? 

Ihu-n'anya di ukwu! 

Ebere di ok'onu! 

Ha genye Ya obi-ha, 

O geme ka ha di'ocha; 

Ha genye Ya onyinye 

O bula nke ha nwere.  


Verse 2 

Gini k'umu-nta geme, 

N'inye Jisus onyinye, 

Onye nke nechebe ha, 

Onye nke nenye ha nri? 

Ebube nke di ukwu 

Amara di ok'onu, 

K'O ji nagozi ha dum. 

Gini k'umu-nta geme? 

Ha geto Ya otuto 

N'ihi n'O nenye udo.  


Verse 3 

Gini k'umu nta geji 

Aka-ha n'ukwu-ha me? 

Onu-ha gekwu gini 

Igosi ihu-n'anya? 

Ha ganagu Bible Nso, 

Ha ganeso kwa uzo 

Kraist Jisus, Onye-nwe-ha, 

Nakpoku aha nke-ya; 

Ka ha bia so Jisus ta: 

Ha geso Ya la n'igwe. Amen.

 Abu 393- Gini k'umu-nta genye  

Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.


We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.

.Site Credit: 9jainformed.com


Post a Comment (0)
Previous Post Next Post