Abu 398- Tutu ayi ejikere ije nke-ayi

Abu 398- Tutu ayi ejikere ije nke-ayi

 Abu 398- Tutu ayi ejikere ije nke-ayi  

Abu 398- Tutu ayi ejikere ije nke-ayi
Abu 398- Tutu ayi ejikere ije nke-ayi  


Verse 1 

Tutu ayi ejikere ije nke-ayi, 

Ayi mara na Gi b'onye gedu ayi; 

N'oge ayi garapu, biko, duru ayi: 

Nani Gi k'ayi natukwasi obi.  


Verse 2 

O buru n'ayi ewere ukwu neje, 

Biko, chupur'ayi ndi ajo madu; 

Ekwela k'ajo anu zu ayi n'uzo: 

Ayi nario Gi k'I nuru olu-ayi.  


Verse 3 

O buru n'ayi ewere moto neje, 

Biko, bur'Onye gedu ayi n'uzo; 

Ekwela Ekwensu meru ayi aru: 

Nonyere onye nke nanya moto.  


Verse 4 

Nime ugbo-miri, nedugide ayi 

Tinyua ebili dum di na miri; 

Mechie onu ajo anu di na ya: 

Gi Onye mere k'ebili dajua.  


Verse 5 

N'ebe o bula  ayi no, nechebe ayi: 

Onye gazoput'ayi m'obugh nani I? 

Gi bu Onye-inye'aka nke umu Gi: 

Biko, nedebe umu-Gi n'udo. Amen.

Abu 398- Tutu ayi ejikere ije nke-ayi  

Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.


We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.

.Site Credit: 9jainformed.com


Post a Comment (0)
Previous Post Next Post