Abu 48- Haleluya! Haleluya!

Abu 48- Haleluya! Haleluya!

 Abu 48- Haleluya! Haleluya!


 


Verse 1

Haleluya! Haleluya!

K'obi n'olu-ayi neto,

Nabuku Chuku ab'onu,

Nabu abu otuto.


Onye nwuru n'elu obe

N'ihi nzọputa nke-ayi,

Jisus Kraist, Eze otuto,

Si n'onwu bilie ozo.


Verse 2

Ugbu a etiwawo ili,

Kraist si n'onwu ban a ndu,

Ndu ebube nk'ebigh-ebi,

N'ututu ubọchi ta;


Ayi gesoro Kraist we meri,

Site na ike nke-Ya;

So Ya ban a nd'ebigh-ebi,

Site  na Nbilite-Ya.


Verse 3

Kraist, Onye bu Nkpuru nke mbu

Mus'ayi amara nk'igwé,

Ihu-n'anya ika ihe

Si n'iru Ya nenwupu:


K'ayi d'obi-ayi n'elu igwé,

Namiri Gi nkpur-ọma,

Nke genye Gi otuto rue

Mgbe ayi gahu iru-Gi.


Verse 4

Haleluya! Haleluya!

Otutọ diri Chuku,

Diri Nna, n'Onye-nzọputa

Kraist, bu Onye nwe nmeri;


Otutọ di-kwa-ra Mọ Nsọ,

Is'iyi nk'ihu-n'anya;

Haleluya! Haleluya!

Diri Atọ nim'Otu. Amen.

Abu 48- Haleluya! Haleluya!

Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.


We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.

.Site Credit: 9jainformed.com

Post a Comment (0)
Previous Post Next Post