Abu 54- Ekele! Eze Galili.

Abu 54- Ekele! Eze Galili.

 Abu 54- Ekele! Eze Galili.


 

Verse 1

Ekele! Eze Galili,

Onye eledar'anya!

Jisus, Gi huru ahuhu,

Nye ayi nzọputa n'efu;

Ekele! Onye-nzọputa,

Onye nwuru n'ihi ayi;

N'olu-Gi ka ayi nwer'udo,

Ayi nwere ndu n'aha-Gi.


Verse 2

Nw'aturu Chuku rotara

K'Ọ buru nmehie-ayi dum;

Site n'ihu-n'anya ukwu

K'I ji kpuchi nmehie-ayi;

Ndi-Gi nile nwe ngbahara

Site n'ik'obara-Gi;

On'uz'ama nk'igwé meghe,

Ayi na Chuku di n'udo.


Verse 3

Jisus, ekele diri Gi

N'och'ebub'ebigh-ebi!

Usu nile nke di n'igwé

Naspur'I n'iru NNa-

N'ebe I narioro ndi-njọ,

Nedozir'ayi onodu,

Narior'ayi mgbe ebigh-ebi,

Rue mgbe ayi genw'otuto.


Verse 4

Gin we nsọpuru na ike,

Gin we kwa ngọzi nile;

Otutọ mgbe ebigh-ebi

Kwesiri ka ayi nye Gi!

Unu ndi-m'ozi nye aka,

Wer'abu ọma nile,

Nako olu ọma Jisus,

Neto Kraist Immanuel! Amen.

Abu 54- Ekele! Eze Galili.

Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.


We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.

.Site Credit: 9jainformed.com


Post a Comment (0)
Previous Post Next Post