Abu 88- Onye etere manu.

Abu 88- Onye etere manu.

 Abu 88- Onye etere manu.


 

Verse 1

Onye etere manu,

Ọkpara nsọ Devid!

Ekele, na mgb'akara

K'Ọ malite ichi

Ọ biar'iwepu nmegbu

K'Ọ kpochapu kwa nmehie,

B'Eze n'ez'omume.


Verse 2

Dik'igirigi ngọzi

K'Ọ biara n'el'uwa;

Onu na ihu-n'anya

Nepute n'uzọ-Ya.

Udo ka agekwusa

N'iru Ya n'el'ugwu;

Ez'omume geru kwa

Dik'iju n'uwa dum.


Verse 3

Ọ ji omiko leta

Ndi anemekpu'au,

Nyere nd'ogbenye aka,

Gba nd'ike gwur'ume;

Is'ude-ha gho abu,

Abali gho ihe;

Mọ-ha nk'amara ikpe,

Di'ok'onu n'anya-Ya.


Verse 4

Nd'eze gad a n'iru Ya,

Weta ih'onyinye;

Mba nile ganefe Ya,

Nako otuto-Ya;

Mgbe dum k'agekpere Ya,

Neme nkwa kw'ubọchi;

Al'eze-Ya bar'uba,

Al'ez'ebigh-ebi.


Verse 5

Ọ ganodu n'och'eze

Nemeri nd'iro dum;

Otutọ-Ya nagbasa,

Ngozi-Ya dir'ora.

Ogbugba-ndu-Ya nadi

We rue mgb'ebigh-ebi;

Aha-Ya wnwegh ngbanwe,

Aha ihu-n'anya.   Amen.

Abu 88- Onye etere manu.

Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.


We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.

.Site Credit: 9jainformed.com

Post a Comment (0)
Previous Post Next Post