2022 Anglican Bible Study Igbo - Study 5 (IHE OMUMU NKE ISE)

2022 Anglican Bible Study Igbo - Study 5 (IHE OMUMU NKE ISE)

2022 Anglican Bible Study Igbo - Study 5 (IHE OMUMU NKE ISE)

IHE OMUMU NKE ISE

Sonde Nke Ano ka Epifani Gasiri  JENUWARI 30, 2022

ISIOKWU: Onyenweanyi Chineke Na Ochichi nke udo

NKEBI ISIOKWU: Uzo Nkpughe nke Chineke Nye Mmadu (Agba nke ano)

ISIOKWU: Ndi Amuma

EBE AGAAGU: 1 Ndi Eze 22:1 -28

EBUM N'OBI IHE OMUMU A

i.  Ka akparita uka banyere onodu onye Amuma.

ii. Ka akparita uka na mkpa odi irubere ndi Amuma nke Chineke isi.


OKWU NKOWA

 Dika o di na Opupu 4:12, onye amuma bu onu n'ekwuwaputa okwu nke Chineke. N'ime agba ochie nakwa agba ohuu nile, ndi amuma Chineke n'ekwuwaputa okwu nke Chineke site n'ike. N'ebe anyi guru ihe ogugu nke taa, anyi nwere ike ihu ndiiche putara ihe di h'etiti ezi ndi amuma nke Chineke na ndi bu nke ugha.

Otu o si na di, anyi na-ahuta n'ime okwu Chineke na enwere ndi amuma n'ebu amuma n'anu ahu ma nwekwa ndi n'ebu amuma n'ime moo nke Chineke. Keduzi ka anyi gesi choputa nke bu nke n'etiti ndi amuma ndi a? Ebe nile anyi ga-agu n'ime akwukwo nso ga-aburu anyi ihe ngosi ihe maka nke a nakwa ihe ndi ozo yiri nke a.


IHE OMUME                            

1. Site n'ebe anyi guru taa, onye bu onye amuma? Were 1 Ndi Eze 22:7
tunyere Hosia 12:10; Emos 3:7

2.  Nwalee ozi nke amuma di na 1 Ndi Eze 22:13-14 ma choputa ndi iche
di n'etiti ndi amuma nke Chineke na ndi n'ebu amuma n'uche nke anu
aru ha.

3.  N'ebe ndi a aga agu ugbu a, kpoputa otutu njirimara ezi ndi amuma
nke Chineke. 2 Ndi Eze 5:15-19, Jer 1:6-8, ma kpoputa, kwue ihe mere
eji rube isi nye ya.

4. Kedu ka ije ozi nke amuma jiri buru ihe agwotoro agwoto n'ogbo anyi taa? Guo 1 Ndi Eze 13:19-22, 2 Ndi Eze 5:20 - 25


OKWU NCHIKOTA

Dika e nwere ezi ndi amuma nke Chineke n'otu aka ahu, enwekwara ndi n'ebu amuma n'uche nke anu am ha ndi obu nani uru n'ezighi ezi, na ochicho nke onwe nakwa iripia ndi mmadu ka ha ji ebu amuma. Ibiaru onwe anyi nso nye Chineke ya na inwe moo nchuputa ga enyere anyi aka irabe isi nye ndi ezi amuma nke Chineke ma rie mbombo oso n'ebe ndi amuma adigboroja no.

OKWU NTUGHARI N'UCHE: Ndi ezigbo amuma unu ndi n'ezi ozi nke Chineke, ha abughikwa onye Nzoputa.

AMAOKWU IBU N'UCHE: Hosea 12:10 "Agwawokwam ndi amumam okwu, obukwa mu onwem mere ka ohu baa uba, o bukwa site n'aka ndi amuma kam ji ihe ama atu

 

 

2022 Anglican Bible Study Igbo - Study 5 (IHE OMUMU NKE ISE)

2022 Anglican Bible Study Igbo - Study 5 (IHE OMUMU NKE ISE)

 

Post a Comment (0)
Previous Post Next Post