Abu 109- Jisus, ekwerewom nkwa

Abu 109- Jisus, ekwerewom nkwa

 Abu 109- Jisus, ekwerewom nkwa


 

Verse 1

Jisus, ekwerewom nkwa

Ife I rue ogwugwu;

Biko, no nsọm mgbe nile,

Onye-nwem n'Enyi nkem.


M'gagh-atu egwu agha

M'I nodu n'akukum;

M'gagh-ejehie n'uzọ-Gi

M'I buru Onye-ndum.


Verse 2

Ka m'mata na Gi no nsọm,

Uwa no nsọm mgbe dum;

M'nahu ih'isu-ngongo,

M'nanu ol'onwunwa.


Nd'irom no nsọm mgbe nile,

No nimem, n'akukum;

Ma Jisus, bia nsọm kari,

Gbopur'obim nmehie.


Verse 3

Biko, ka m'nuru okwu-I,

Olu d'ezie nwayọ,

Nke kar'olu agu-njọ,

N'olu nnupu-isim.


Kwue k'I we kasiem obi,

Gbam ume, jidekwam;

Biko, kwue, me ka m'ge nti,

Gi Onye-nche obim.


Verse 4

Jisus, Gi kwere nkwa nye

Ndi nile neso Gi,

N'ebe I no n'otuto,

Eb'ahu ndi-Igano.


Jisus, ekwerewom nkwa

Ife I rue ogwugwu;

Nyem amra ka m'neso

Onye-nwem n'Eyi nkem.


Verse 5

Biko, ka m'hu nzo-ukwu-I,

Zonye nkem nime ha;

Olil'anya na m'geso

Bu nani n'ike-Gi.


Biko, kpom, dorom, nedum,

Nejidemmgbe nile;

Kpobatakwam n'el'igwé,

Onye-nzọtam n'Enyim .Amen.

 Abu 109- Jisus, ekwerewom nkwa

Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.


We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.

.Site Credit: 9jainformed.com

Post a Comment (0)
Previous Post Next Post