Abu 110- Jisus, eburuwom obem.

Abu 110- Jisus, eburuwom obem.

 Abu 110- Jisus, eburuwom obem.


 

Verse 1

Jisus, eburuwom obem

Irap'uwa sobe Gi;

Ogbnye eledar'anya,

I gabu ihem nile.


K'ihe m'ler'anya la n'iyi,

Ihe m'choro, nke m'mara !

Le k'onodum si di elu,

Chineke n'igwé bu nkem !


Verse 2

Madu gesogbum, kpagbukwam,

Ogeme ka m'gbakute I;

Onwunwa-ndu gabikwasim,

igwé gwet'iz'ike.


Ahuhu agah-ewutam

Mgbe ihu-n'anya-I bu nkem;

Onu agah-atom utọ,

Nke nesitegh n'aka-Gi.


Verse 3

Nara nzọputa-I, nkpur'obim;

Merie nmehie na nchegbu;

Nuria, n'onodu o bula

I gachot'olu di nkpa !


Cheta Mọ Nsọ bi nime gi,

Chet'ihu-n'anya nke Nna;

Chet'Onye-nzota nke nwuru:

Nwa nk'igwé, atamula !


Verse 4

Si 'amara ba n'otuto,

Jid'okwukwe n'ekpere;

Ndu ebigh-ebi di n'iru,

Chineke geduzi gi.


Ozi-gi n'uwa gebi ngwa,

Ubochi ije-I gagwu;

Olil'anya nenwe nmezu,

Ekpere gagh'otuto. Amen.

Abu 110- Jisus, eburuwom obem.

Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.


We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.

.Site Credit: 9jainformed.com

Post a Comment (0)
Previous Post Next Post