Abu 137- N'utut'ubọchi Nbilite

Abu 137- N'utut'ubọchi Nbilite

 Abu 137- N'utut'ubọchi Nbilite


 

Verse 1

N'utut'ubọchi Nbilite

Obi n'aru zuk'ozo;

Akwa na ir'uju adigh

M'obu ngbu.


Verse 2

N'ebe a ha kewara nw'oge,

Aru debe iz'ike,

Neche nimke ndaju di nsọ,

No n'ura.


Verse 3

Nwa mgbe  k'aru ike gwuru

No n'ebe iz'ike-Ya;

Rue mgbe chi nke Easter ọma

Bo-kwa-ra.


Verse 4

M'obi natughri uche

Nekpesi ekper'ike

Tiwa n'ubọchi Nbilite

Nim'abu.


Verse 5

Obi n'aru ejik'ozo,

Ọ digh ihe gekewa;

Teta nime udi nke Kraist,

Zue oke.


Verse 6

A! Ima-nma n'oke onu

Nk'ubọchi Nbilit'ahu,

Nke nagagh-agabiga kwa

Mgbe nile.


Verse 7

N'utut'onu Easter ahu,

Ili nyeghach'ozu-ha;

Nna, na nne, na nwa, na nwa-nne

Zuk'ozo.


Verse 8

Na nzuk'ahu kachasi nma,

Kraist, wet'ayi n'ikpe-azu;

K'ayi si n'onwu n'ikpe jide

Obe-Gi. Amen.

Abu 137- N'utut'ubọchi Nbilite

Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.


We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.

.Site Credit: 9jainformed.com

Post a Comment (0)
Previous Post Next Post