Abu 138 - M'gēji obim nile kele Gi

Abu 138 - M'gēji obim nile kele Gi

 Abu 138 - M'gēji obim nile kele Gi



verse 1
1


M'gēji obim nile kele Gi:

N'iru chi nile ka m'agābùku Gi abù ọma.
Verse 2
M'gākpọ isi ala n'ebe ulo uku nsọ Gi di,
M'gēkele kwa aha-Gi n'ihi ebere-Gi na n'ihi ezi-okwu-Gi:
N'ihi na I mewo ka okwu-ọnu-Gi di uku n'elu aha-Gi nile.
3N'ubọchi m'kpọkuru Gi ka I zaram,
I nēji ike di na nkpuru-obim kpaliem.
4Eze nile nke uwa gēkeli Gi, Jehova,
N'ihi na ha anuwo okwu nile nke ọnu-Gi.
5Ha gābù kwa abù bayere uzọ nile nke Jehova;
N'ihi na ebube Jehova di uku.
6N'ihi na Jehova di elu, ma ọ bu onye di ume-ala n'obi ka Ọ nāhu anya:
Ma onye-npako, Ọ nēsite n'ebe di anya mara ya.
7Ọ buru na ejeghariam n'etiti ahuhu,
I gēme ka m'di ndu; I gēseti aka-Gi imegide iwe ndi-irom,
Aka-nri-Gi gāzọputakwam.
8Jehova gēmezurum ihe nile:
Jehova, ebere-Gi nādiru mb͕e ebighi-ebi;
Arala aka n'ọlu nile nke aka-gi abua.
Post a Comment (0)
Previous Post Next Post