Abu 16- Jisus, uwem di ebube

Abu 16- Jisus, uwem di ebube

Abu 16-  Jisus, uwem di ebube



Verse 1

Jisus, uwem di ebube

B’ez’omume n’obara-Gi;

Mgbe uwa nile gagb’oku,

Agamanuri kwa onu.


Verse 2

Ndu na onwu enwegh ike

Imebi uw’ebube nkem;

Uwe ọma Jisus nenye

Nadi ohu rue mgbe nile.


Verse 3

Mgbe m’si n'ọnwu, bilie ije

N’ulo omam di n’el’igwé;

Mgb’ahu, ngopum nile gabu:

Jisus di ndu, nwu kwa n’ihim.


Verse 4

N’uboch’ahu m’gagh-at’ujo,

Onye pur’ibom ebubo?

Obara Jisus newepu

Nkocha, n’ihere nke nmehiem.


Verse 5

Ka ndi nwur’anwu nur’olu-I;

Jisus, gwa ndi nke-Gi nuria;

Obara-I n’ezi-omume-I

Bu uwe ebube nke ha.


Verse 6

Chuku nk’ihu-n’anya n’ike,

Kwe k’uwa mara ebere-I;

Ka okwu nke-Gi gbasa kwa,

Meri onwu na oku-mo.   Amen


Abu 16-  Jisus, uwem di ebube

Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.


We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.

.Site Credit: 9jainformed.com


Post a Comment (0)
Previous Post Next Post