Abu 19- Ge nti! Ndi-m’ozi nabu

Abu 19- Ge nti! Ndi-m’ozi nabu

 Abu 19-  Ge nti! Ndi-m’ozi nabu

 



Verse 1

Ge nti! Ndi-m’ozi nabu

Neto Ez’amur’ohu;

Udo di n’elu uwa,

Chuku na ndi-njọ edo!

Nuria onu mba nile,

Soro n’onu nke igwé;

igwé na ala nasi,

Ta k’amuru Jisus Kraist.


Verse 2

Kraist, Onye nd’igwé naja;

Kraist, Eze ebigh-ebi;

Na mgbe nke-Ya k’Ọ biara,

Nwa nke Agbogho di nsọ.

Le, Chuku yiri aru;

To Onye ghoro madu;

Ọ toro Y’igho madu;

Jisus Kraist, Immanuel.


Verse 3

Kelenu Eze udo,

Kel’Onye-ez’omume;

Ihe na Ndu k’Ọ ji bia,

Nagwo oria madu dum.

Ọ rapur’ebube-Ya,

Bia ka madu ghar’inwu,

Ka madu nile bilie,

Ka amukwa ha ohu.


Verse 4

Bia, Onye mba dum nachọ,

Biri nime ayi nile;

Bilie, Nkpuru nke nwayi,

Chifia isi nke Agwo.

Hichap’onyinyo Adam,

Tiyechie onyinyo-Gi;

Nye madu dum Onwe-Gi,

Kpua Onwe-Gi n’obi-ayi.   Amen


Abu 19-  Ge nti! Ndi-m’ozi nabu

Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.


We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.

.Site Credit: 9jainformed.com

Post a Comment (0)
Previous Post Next Post