Abu 20- Mgbe ndi naz’aturu neche

Abu 20- Mgbe ndi naz’aturu neche

Abu 20-  Mgbe ndi naz’aturu neche

 



Verse 1

Mgbe ndi naz’aturu neche
Aturu n’abali,
M’ozi we bia guzọ ha nsọ,
Ok’ebube nwuba.

Verse 2

“Atula egwu,” o siri,
Ka egwu natu ha,
“Ozi ọma nk’oke onu
Ka m’nezi unu dum.”.

Verse 3

“Ta, nim’obodo nke Devid,
K’amuru nye unu
Onye-nzọputa nke bu Kraist,
Nka gabu ih’ama: –

Verse 4

Unu gahu Nwa ekere
Nim’akwa-okike,
Dina n’ihe anetiye
Nri nke anu-ulo.”.

Verse 5

Otu a k’o kwuru; le, ha hu
Usu ndi mo-ozi,
Ndi nenye Chinek’otuto;
Ha nabu abu, si: –

Verse 6

“Otutọ diri Chineke
N’ebe kasi elu,
Udo n’uwa nime madu
Rue mgbe ebigh-ebi.”     Amen.



Abu 20- Mgbe ndi naz’aturu neche 

Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.


We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.

.Site Credit: 9jainformed.com
Post a Comment (0)
Previous Post Next Post