Abu 207- Nime abali nk'ahuhu

Abu 207- Nime abali nk'ahuhu

 Abu 207- Nime abali nk'ahuhu

Abu 207- Nime abali nk'ahuhu
Abu 207- Nime abali nk'ahuhu


Verse 1

Nime abali nk'ahuhu

Nd'ije Chineke naga,

Nabu abu nk'olil'anya,

N'ala ekwere  na nkwa.


Verse 2

N'iru ayi nim'ochichiri

Ihe nedu ayi nenwu;

Nwa'nne nejid'aka nwa-nne,

Nazo ije n'ob'ike.


Verse 3

Ihe nk'iru Chuku b'otu,

Namukwasi ndi-nkeYa,

Nachupu egwu na ngbachi,

Nenye ihe n'uzọ-ayi.


Verse 4

Nzube nk'ije-ayi bu otu,

N'okwukwe nadigh agwu,

N'olil'anya nanu oku

Nke Chineke natute.


Verse 5

Abu nk'igwé madu nabu

Dika nke si n'ot'obi;

Otu agha, n'ih'ize-ndu,

Otu ije rue Chuku.


Verse 6

Otu inuri-onu di

N'al'ebigh-ebi ahu,

Ebe Nna nke kachas'ike

Nabu eze mgbe nile.


Verse 7

Naga n'iru, ndi no n'ije,

K'obe bur'inye'aka-ayi;

Bur'ihere-ya lua ogu,

Ayi gez'ike na ndo-ya.


Verse 8

Mgbe oke nbilite di nsọ,

Ili gemeghe oghe,

Onyinyo

 nile gagbasa

Ngbachi na ndogbu gagwu. Amen.

Abu 207- Nime abali nk'ahuhu

Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.


We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.

.Site Credit: 9jainformed.com



Post a Comment (0)
Previous Post Next Post