Abu 21- Ndi Kraist, teta, kel'utut'ona nka.

Abu 21- Ndi Kraist, teta, kel'utut'ona nka.

  Abu 21-  Ndi Kraist, teta, kel'utut'ona nka

 

 


Verse 1

Ndi Kraist, teta, kel'utut'ona nka,

Mgbe amur'Onye-nzọputa nk'uwa;

Bilie, to ihu-n'anya Chineke,

Nke ndi-m'ozi si n'el'igwé neto;

Ha bu uzọ zi ozi om'ahu

Na Nwa Chineke ghoro Nwa madu.


Verse 2

Mgbe ahu ndi neche aturu-ha

Nur'olu otu m'ozi si ha: “Le,

Ewetaram unu ozi ọma

Na amur'unu Onye-nzọputa:

Chineke emezuwo nkwa-Ya ta,

Ta k'amuru Onye-nzọputa, Kraist,”


Verse 3

Ọ kwusia; ma, le, ndi-abu nk'igwé

Ji onu b'abu akanugh na mbu,

Neto ihu-n'anya nke Chineke,

Haleluya-ha juputa igwé;

Otutọ Chineke bu abu-ha,

Udo di n'uwa n'etiti madu.


Verse 4

Ndi-nch'aturu jeer na Betlehem

Ihu ih'ebube Chuku mere;

Ha hu Josef, na Meri di ngọzi,

Na Nwa o muru, bu Onye-nwe-ayi;

Ha we ko akuko ebube nka,

Buru nd'ozi mbu nke Nw'ohu ahu.


Verse 5

Ọ kwesir'ayi, dika ndi-nch'aturu,

Ij'ekele zisa oz'ọma nka;

Soro Jisus, b'Onye-ngbaputa-ayi,

Site n'omumu-Ya rue n'onwu-Ya;

Neso nzo-ukwu-Ya n'ike nke-Ya,

Rue mgbe ayi genwe onodu n'igwé.


Verse 6

Mgb'ahu n'etiti ndi bi n'el'igwé,

Ayi gabu abu onu ngbaputa;

Onye amuru ta geme k'ayi hu

Ebube-Ya gburugburu ayi dum;

Ayi gabu abu mgbe ebigh-ebi,

Neto Eze ndi-m'ozi na madu. Amen



Abu 21-  Ndi Kraist, teta, kel'utut'ona nka.

Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.


We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord

Post a Comment (0)
Previous Post Next Post