Abu 36- Ge nti! olu ihu-n'anya.

Abu 36- Ge nti! olu ihu-n'anya.

 Abu 36- Ge nti! olu ihu-n'anya.


 


Verse 1

Ge nti! olu ihu-n'anya

Nke nada na Kalvari;

Le, o nagbawa kwa nkume,

Kwaghar'uwa, kpuch'igwé;

“Ọ gwusiwo,”

Nur'olu'Onye-nzọputa.


Verse 2

“Ọ gwusiwo.” Le, ob'utọ

Okw'ebube ndia nyere!

Ngozi igwé nenwegh atu

Si na Kraist nerudata.

“Ọ gwusiwo,”

Ka ndi-Ya chet'okwu nka.


Verse 3

“Ọ gwusiwo,” onyinyo dum

Bu nk'iwu mgb'ochie nwere;

Emezuwo nkwa Chineke;

Onw'apugh iy'egw'ozo.

“Ọ gwusiwo,”

Nsi-Ya nwe nkasi-obi.


Verse 4

Ndi-m'ozi, chir'ubo-unu,

Tob'aha Immanuel.

ndi bi n'uwa, ndi bi n'igwé,

Sorornu n'abu nmeri.

Haleluya!

To Nw'aturu Chineke. Amen.

 Abu 36- Ge nti! olu ihu-n'anya.

Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.


We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.

.Site Credit: 9jainformed.com

Post a Comment (0)
Previous Post Next Post