Abu 35- Anwurum n'ihi gi.

Abu 35- Anwurum n'ihi gi.

 Abu 35- Anwurum n'ihi gi.


 


Verse 1

Anwurum n'ihi gi,

We wusi obaram,

K'ewe gbaputa gi,

K'i ba na ndu ohu.

Anwurum n'ihi gi;

Gini ka gi merem?


Verse 2

Ejim otut'aro,

N'ik'ogwugwu n'akwa,

Ime ka gi we nwe

Onu ebigh-ebi.

Enyerem arom dum;

Ole ka gi nyerem?


Verse 3

Ulo ihe nke Nnam,

Och'ezem mara nma,

Ka M'rap'ru bia n'uwa

Ino n'ihe-nwuta.

M'rapuru ha n'ih'i;

Gini k'i rapura?


Verse 4

Ahuhu M'huru gi,

Ibu-obi d'ilu,

Ha nanaputa gi

N'onwu ebigh-ebi.

Ahuhu ka M'huru i;

I gahuum gini?


Verse 5

Ewetaram nye gi,

Site n'ulom n'igwé,

Nzọputa na udo,

Na ihu-n'anya nkem.

Akum ka M'wetara i;

I wetaram gini?


Verse 6

Onye-nwem, ka m'nye ndum,

Ka m'nye arom nile/;

Ka m'opu agb'uwa

N'ihi Gi, Chinekem.

Gi nyerem Onwe-Gi;

Le, enyem I onwem. Amen.

Abu 35- Anwurum n'ihi gi.

Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.


We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.

.Site Credit: 9jainformed.com

Post a Comment (0)
Previous Post Next Post