Abu 39- Ndu di n'ih'ile Ony'akpogburu anya.

Abu 39- Ndu di n'ih'ile Ony'akpogburu anya.

 Abu 39- Ndu di n'ih'ile Ony'akpogburu anya.


 


Verse 1

Ndu di n'ih'ile Ony'akpogburu anya,

Ndu diri gi na mgbe di ugbu a;

Le Y'anya, onye-njọ, k'Ọ we zọputa gi,

Ya bu Ony'egburu n'osisi.


Kọrọs:-

Le! le! k'i di ndu!

Ndu di n'ih'ile Ony'akpogburu

anya,

Ndu diri gi na mgbe di ugbu a.


Verse 2

Gini k'Ọ ji no ka Onye nebupu njọ,

M'o buru na ebogh Jisus njọ-i?

Obar'isacha njọ neru n'aru-Yanya,

Ma onwu-Ya akwugh ugw-gi?


Verse 3

Ọ bugh anya-miri-i m'obu ekpere-gi,

Ọ b'obara nekpuchi nmehie-i;

Ngwa biakute Jisus Onye nebu njọ-gi,

Wusi-kwa-ra gi obara-Ya.


Verse 4

Enwela ob'abua, n'ihi na Chineke si

N'o digh ihe fọduru ime;

Na Ọ biara otu ugbo na uwa nka,

Lusia olu Ọ malitere.


Verse 5

Ngwa, were onu nara Jisus ososo,

Ndu ebigh-ebi Ọ nenye gi;

Mara na nkpuru-obi-gi apugh inwu,

N'ihi na Jisus di mgbe nile. Amen. 

Abu 39- Ndu di n'ih'ile Ony'akpogburu anya.

Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.


We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.

.Site Credit: 9jainformed.com


Post a Comment (0)
Previous Post Next Post