Abu 395- Ekelem Gi, Nnam, Chinekem

Abu 395- Ekelem Gi, Nnam, Chinekem

 Abu 395- Ekelem Gi, Nnam, Chinekem  

Abu 395- Ekelem Gi, Nnam, Chinekem
Abu 395- Ekelem Gi, Nnam, Chinekem  


Verse 1 

Ekelem Gi, Nnam, Chinekem,  

Otutu ihe K'I nyerem,  

Abum nwa nke-Gi, lekwasim,  

Nara ekelem Onye-nwem.   

Obim nanu onu nk'ukwu,  

Nabukuru Gi n'ezi'abu.  

Ahuwom ubi na nkpuru-ya, na nri k'o bu,  

Imewo.   

Ahuwom akwukwo nepu ohu, uto k'obu,  

O di nma.  

Ahuwom nnunu n'anumanu, n'azu-ndu kwa, 

I kere ha.   

Ahekere na ji, Manu n'akidi, Nkwu na oji,  

Osisi nile na nkpuru ha nami kw'aro,  

Neto Gi, Ony'oma, Ony'ebube!   


Verse 2  

Nd'uzu nakpu ogwuji,  

Ih'ozo aneji n'olu ubi,  

Umu-nwayi nakp'ute na nkata,  

Osisi ka ndi-nka nalu kwa,   

Ndi nagbaso ihe ndi-beke,  

Nma k'olu di n'anya-Gi.  

I huwo ihe Chukwu kere, n'otuto k'o bu?  

To aha-Ya.   

I huwo nmeso oma-Ya, n'o di ukwu?  

Gozie Ya.  

I huwo n'amara-Ya di ebigh-ebi?  

Cheta nka.   

O nyer'ayi umu, Imu-nn'ayi n'eyi,  

N'ihu-n'anya-ha,  

Gozienu Chukwu n'ebe nile O nachi,  

Chinekem, Onye-nwem, Nonyerem!

Abu 395- Ekelem Gi, Nnam, Chinekem  

Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.


We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.

.Site Credit: 9jainformed.com


Post a Comment (0)
Previous Post Next Post