Abu 72- Okwu nke ghoro madu.

Abu 72- Okwu nke ghoro madu.

 Abu 72- Okwu nke ghoro madu.


Au 72- Okwu nke ghoro madu.
Abu 72- Okwu nke ghoro madu.

Verse 1

Okwu nke ghoro madu,

Amam-ihe nk'igwé,

Ez'okwu nenwegh ngbanwe,

Ih'ayi n'ochichiri;


Ayi to Gi n'ihi ihe

Si n'Okwu nsọ-I puta;

Oku diri ukwu-ayi,

Nenwu mgb'ebigh-ebi.


Verse 2

Nzuko nka Kraist natara

Okwu Chuku ahu;

o bulir-ihe ahu

K'Ọ mukwasi uwa.


Ọ bu igbe nke aku

Juru n'Ezi-owu;

Obu ezi onyinyo

Nke Kraist, bu Okwu Ndu.


Verse 3

Ọ di ka okoloto

N'iru nd'agha Chuku;

Ọ bu oku nagb'ama

N'ochichiri uwa;


Ob'ihe nego'uzọ

N'osimiri ndu nka,

Nime ihe ize-ndu ,

Dur'ayi biakute Kraist.


Verse 4

Jisus me ka Nzuko-Gi

Di k'oku nenwu'enwu,

Nke gegosi mba nile

Ihe-I k'o di na mbu;


Zi ndi-ije-Gi nile

Ka ha soro Ihe a

Rue mgb'ochichiri gebi,

Ha hu iru-I n'onu.   Amen.

Abu 72- Okwu nke ghoro madu.

Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.


We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.

.Site Credit: 9jainformed.com


Post a Comment (0)
Previous Post Next Post