Abu 91- N'ihi ndi nsọ, nez'ike n'olu.

Abu 91- N'ihi ndi nsọ, nez'ike n'olu.

 Abu 91- N'ihi ndi nsọ, nez'ike n'olu.


 

Verse 1

N'ihi ndi nsọ, nez'ike n'olu,

Ndi ji okwukwe kwusa Gi n'uwa,

K'aha-Gi, Jisus, bur'aha ngọzi.

Aleluya !


Verse 2

Gi b'ebe-ngbaba, nkume, n'ike-ha;

Gi b'Ochi-agha n'agha-ha nile;

Gi nim'chichiri b'ez'ihe-ha.

Aleluya !


Verse 3

Ka ndi-agha ọma-Gi, ndi d'ike,

Lua ogu-ha ka ndi nsọ nke mgb'ochie,

Soro ha nweta okpu nke nmeri.

Aleluya !


Verse 4

Nriko di ngọzi, nnweko nke di nsọ !

Anyi nalu ogu, ha no n'otuto;

M'ayi b'otu nime Gi, ayi dum bu nke-I.

Aleluya !


Verse 5

M'agha d'ufu, ogu alugide,

Nti nanu abu nmeri nk'el'igwé,

Obi nwe ik'ozo, aka d'ike.

Aleluya !


Verse 6

Anyanwu nenwu s'ike n'anyasi,

Nd'ogu ndi kwesiri gez'ike ngwa;

Ngozi nk'udo nke Paradis d'utọ.

Aleluya !


Verse 7

M'ubọchi otuto ka nma gabo;

Ndi nsọ gebili n'uwe nmeri-ha,

Eze nk'otuto naga n'uzọ-Ya !

Aleluya !


Verse 8

Site n'ala, n' osimiri nile,

Usu agutagh-onu nezuko,

Naburu Nna, n'Ọkpara, na Mọ Nsọ.

Aleluya ! Amen.

Abu 91- N'ihi ndi nsọ, nez'ike n'olu.

Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.


We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.

.Site Credit: 9jainformed.com


Post a Comment (0)
Previous Post Next Post