Abu 95 -Ulo-I n'igwé mara nma.

Abu 95 -Ulo-I n'igwé mara nma.

 Abu 95 -Ulo-I n'igwé mara nma.
 

Verse 1

Ulo-I n'igwé mara nma,

N'al'ihe n'ihu-n'anya;

Ulo-I n'uwa mara nma,

N'ala njọ n'ahuhu nka.


Agu nagu nkpur'obim

Inwe nmeko ndi nsọ-Gi,

Ihu onwunwu iru-I,

N'izu-oke amara-I.


Verse 2

Nnunu nabu ab'onu

N'ebe-ichu-aja-Gi;

Obi onu nez'ike

N'obi Nna nk'elu-igwé !


Dika nduru fur'uzọ

Nahugh ebe-iz'ike,

Ha gala n'ugbo nke-ha,

Nodu n'onu mgbe nile.


Verse 3

Ndi no n'onu neto Gi

Obuna nim'uwa nka;

Miri nasu n'ozara,

Nri si n'igwé nazu ha.


Ha naga n'irun'ike

We rue n'oche-eze-Gi;

Nada n'ukwuGi neto

Onye duru ha n'udo.


Verse 4

Nna, ka m'gbat'ih'ozo nka !

Durum ga n'aj'uwa nka;

Wor'amara-Gi debem,

Nyem onodu n'ulo-Gi.


Anyanwu n'Ota k'I bu,

Dur-obi-nfughari nkem;

Gi nw'otuto n'amara,

Ka ha dirim, Onye-nwem! Amen.

Abu 95 -Ulo-I n'igwé mara nma.

Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.


We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.

.Site Credit: 9jainformed.com

Post a Comment (0)
Previous Post Next Post