Abu 14- N’Aha nke Kraist Jisus

Abu 14- N’Aha nke Kraist Jisus

Abu 14-  N’Aha nke Kraist Jisus

 


Verse 1

N’Aha nke Kraist Jisus

K'ọra gb’ikpere,

Ire dum kwuputa

Eze nk’otuto;

Ọ nato Nna utọ

K’ayi kpo Y’Onye-nw’ayi,

Onye site na mbu

Bur’Okwu d’ike.


Verse 2

O si n’igwé we bia

K’Ọ we new Aha

N’onu ndi-njọ nile,

Ndi nke Ọ biara.

O bur’Aha ahu

Nke nenwegh ntupo,

Weta Ya na nmeri

N’ilugbu ọnwu.


Verse 3

Umu-nnem, tue Y’aha

Nim’ihu-n’anya,

Ma me ya n’it’egwù,

N’obi di’um’ala;

Ọ b’Onye-nzọputa.

Jisus Onye-nw’ayi;

Ony’ora ganefè,

Nenye nsọpuru.


Verse 4

Me Ya Eze n’obi;

Kwe ka Ọ chupu

Ihe dum nadigh nsọ,

Na ihe b’ugha;

Me Ya Onye-isi

N’oge onwunwa;

K’uche-Ya duz’unu

N’ike na ihè.


Verse 5

Umu-nnem, Jisus a

Gabia kwa ozo,

N’otuto nke Nna-Ya,

N’usu ndi-m’ozi;

Okpu-eze nile

Ha gabu nke-Ya;

Obi-ayi gakpo Ya

Eze nk’otuto.  Amen


Abu 14-  N’Aha nke Kraist Jisus

Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.


We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.

.Site Credit: 9jainformed.com

Post a Comment (0)
Previous Post Next Post