Abu 201- Apughm iwezuga Gi.

Abu 201- Apughm iwezuga Gi.

 Abu 201- Apughm iwezuga Gi.


 

Abu 201- Apughm iwezuga Gi.

Verse 1

Apughm iwezuga Gi,

Enyi ndi fur'efu!

I ji obara gbatam

N'oke onu-ahia;

Ezi'omumue-I, ngbahara-I,

N'obara-Gi gabu

Olil'anyam na nkasim,

Otutọm n'agugom.


Verse 2

Apughm iwezuga Gi,

Guzọ nani n'onwem;

Enweghm ike n'idi-nma,

M'obu amam-ihe;

Ma Gi, Onye-nzọputam,

Bu ihe nile nkem;

Ike nim'adigh-ike

Diri ndi dabere I!


Verse 3

Apughm iwezuga Gi!

Enyi ozo amagh

Ochicho di ngbu nk'obi,

Ikwuputa nkpa-ya.

Ony'ozo apugh iba

N'ebe-nzuko nk'obim,

Nye ya ndaju na nkasi,

Onye-nwem, m'obugh Gi!


Verse 4

Apughm iwezuga Gi,

Aro nagabiga;

Ọ digh anya mgbe 'gefe

Miri nk'onwu nanim.

Ma I gagh-agbanarim:

M'ebili maghari,

Amawom n'I gano nsọm,

Nagwam, si, “Ọ bu Mu!” Amen.

Abu 201- Apughm iwezuga Gi.

Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.


We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.

.Site Credit: 9jainformed.com



Post a Comment (0)
Previous Post Next Post