Abu 82- Jisus, nonyere Nzuko-I.

Abu 82- Jisus, nonyere Nzuko-I.

 Abu 82- Jisus, nonyere Nzuko-I.


 

Verse 1

Jisus, nonyere Nzuko-I,

Bur'Eze-Ya n'Onye-ndu,

N'uwa nka nim'onwunwa:

Biko nur'olu-ayi.


Verse 2

Makua ya n'ihu-n'anya,

Zegidere ya nd'iro,

Gugua ya nim'ahuhu:

Biko nur'olu-ayi.


Verse 3

Me k'ozizi na ndu-ya

Di nma, nye ya ntaach'obi,

K'o tukwas'obi na nkwa-I

Biko nur'olu-ayi.


Verse 4

Nonyere ya mgbe nile

K'o ze njehie, k'o nachọ

Otutọ-I mgb-ebigh-ebi:

Biko nur'olu-ayi.


Verse 5

Me k'olu-ya da s'ike,

Nekwu n'ikpe-Gi di nsọ,

Kwuput'Onye-nzọputa:

Biko nur'olu-ayi.


Verse 6

Topu agbu-ya nile,

Me k'ekworo dem kwusi,

Nye udo nk'elu-igwé:

Biko nur'olu-ayi.


Verse 7

K'o bur'otu n'ozizi,

Otu nim'ihu-n'anya,

Neme k'ora kwere Gi:

Biko nur'olu-ayi.


Verse 8

K'o chota ndi fur'efu,

Dur'ogbenyens nd'isi,

Gwo ndi etiwar'obi:

Biko nur'olu-ayi.


Verse 9

K'oku nk'ezi-okwu-ya

Nenwuwa, nenye ihe

Nime ochichiri-njọ:

Biko nur'olu-ayi.


Verse 10

Ekwel'obi-ya j'oyi,

Me ka ndi-nche-ya d'ike,

Gbara ndi nke-I ogige:

Biko nur'olu-ayi.


Verse 11

Ka nd'uko-ya,zua ndi nke-I,

Ndi-nche-aturu nke-Gi

Jiker'idur'umu-Gi:

Biko nur'olu-ayi.


Verse 12

Sachapu njọ-ya nile,

Tinyua ujo o natu,

Wet'onu nmeri-ya ngwa:

Biko, nur'olu-ayi.


Verse 13

K'o nwe otuto nile,

Di ọcha pua na nmehie.

K'o kwesi ibiakute I:

Biko nur'olu-ayi.


Verse 14

Me k'o keta onu-Gi

N'eb'ahu I doziri,

K'onwe ngoz'ebigh-ebi:

Biko nur'olu-ayi.


Verse 15

K'amar'Onye-nzọputa,

Na ihu-n'anya nke Nna,

Na nnweko Mọ Nsọ Nonye:

Biko nur'olu-ayi.     Amen

Abu 82- Jisus, nonyere Nzuko-I.

Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.


We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.

.Site Credit: 9jainformed.com

Post a Comment (0)
Previous Post Next Post